Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 27 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Once it was decided we would sail to Italy, they handed Paul and some other prisoners to a centurion named Julius of the Imperial Cohort. Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.
2 We boarded a ship from Adramyttium bound for the ports along the coast of Asia and put out to sea. Aristarchus, a Macedonian from Thessalonica, was with us. Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a.
3 The next day we docked at Sidon. Julius treated Paul kindly, letting him go to friends for care. Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma.
4 From there we put to sea and sailed along Cyprus's sheltered side, since the winds opposed us. Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs.
5 Having sailed across the open sea off Cilicia and Pamphylia, we came to Myra in Lycia. Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia.
6 There the centurion found an Alexandrian ship sailing for Italy and put us aboard it. Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya.
7 Sailing slowly for many days, we barely reached Cnidus. Since the wind blocked us, we sailed along the sheltered side of Crete, off Salmone. Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee.
8 Barely coasting along, we reached Fair Havens, a place near the town of Lasea. Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.
9 Much time was lost—even the Fast had passed, making sailing dangerous now. So Paul warned them, Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ,
10 "Men, I see this voyage will bring disaster and heavy loss—not only to the cargo and ship, but also to our lives." na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.”
11 But the centurion trusted the pilot and shipowner more than Paul's words. Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru.
12 Since the harbor was unfit for winter, most decided to sail on, hoping somehow to reach Phoenix, a Crete harbor facing southwest and northwest, and winter there. Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
13 When a south wind blew gently, thinking they'd gained their purpose, they weighed anchor and sailed close along Crete. Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit.
14 But before long, a hurricane-force wind called the Northeaster swept down from the island. Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata.
15 The ship was caught and couldn't face the wind, so we gave way and drifted. Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku.
16 Running under a small island called Cauda, we barely managed to secure the ship's lifeboat. Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.
17 Once hoisted aboard, they used ropes to brace the hull. Fearing they'd run aground on Syrtis's sandbars, they lowered the sea anchor and were driven along. Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.
18 The storm battered us so violently that the next day they began throwing cargo overboard. Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri.
19 On the third day, with their own hands they threw the ship's gear overboard. Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri.
20 For many days sun and stars didn't appear, the fierce storm kept raging, and we finally lost all hope of being saved. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị.
21 After they had gone a long time without food, Paul stood among them and said, "Men, you should have obeyed me and not sailed from Crete; then you would have spared yourselves this disaster and loss. Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a.
22 Now I urge you to stay encouraged: none of you will lose your life, only the ship will be lost. Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu.
23 Last night an angel of our Father—the one I belong to and serve—stood beside me, Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m,
24 and said, 'Don't be afraid, Paul. You must stand before Caesar, and look—our Father has given you the lives of all sailing with you.' ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’
25 So take courage, men—I trust our Father: it will be just as I was told. Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m.
26 But we must run aground on some island." Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”
27 On the fourteenth night, still driven across the Adriatic Sea, the sailors sensed near midnight that land was approaching. Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.
28 They sounded and found 120 feet; going a little farther, they sounded again and found ninety feet. Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.
29 Afraid of hitting rocks, they dropped four anchors from the stern and prayed for daylight. Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
30 The sailors tried to escape from the ship, lowering the lifeboat into the sea, pretending to run out anchors from the bow. Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
31 Paul told the centurion and soldiers, "Unless these men stay in the ship, you can't be saved." Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.”
32 So the soldiers cut the ropes holding the lifeboat and let it drift away. Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
33 Just before dawn, Paul urged everyone to eat, saying, "This is the fourteenth day you've waited anxiously, without food, having eaten nothing. Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla.
34 So I urge you to eat—this is for your survival. Not a hair from any of your heads will be lost." Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.”
35 Saying this, he took bread, thanked our Father before them all, broke it, and began to eat. Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
36 They were all encouraged and ate some food themselves. Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri.
37 Altogether there were 276 of us on board. Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
38 Once satisfied with food, they lightened the ship by tossing the grain into the sea. Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.
39 At daylight they did not recognize the land, but noticed a bay with a sandy beach, and planned, if possible, to run the ship aground there. Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee.
40 They cut the anchors loose, leaving them in the sea, and at the same time untied the rudder ropes. Then they hoisted the foresail to the wind and headed for the beach. Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.
41 But hitting a sandbar where two currents met, they ran the ship aground—the bow stuck fast, unmoving, while the waves' force broke the stern apart. Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.
42 The soldiers planned to kill the prisoners so that none of them could swim away and escape. Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo.
43 But the centurion, wanting to save Paul, stopped them from their plan, and ordered those who could swim to jump in first and get to shore, Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.
44 and the rest—some on planks, some on ship debris. So everyone reached land safely. Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]