Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 34 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 And our Father spoke to Moses, saying, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "command the Israelites: when you enter the land of Canaan, this is the land that will fall to you as inheritance—the land of Canaan, within its borders. “Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
3 Your south side runs from the Zin wilderness along Edom's edge; your south border starts at the Dead Sea's end, eastward. “ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,
4 Your border will turn south of the Ascent of Akrabbim, cross to Zin, reach south of Kadesh-barnea, go on to Hazar-addar, and pass to Azmon. gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,
5 From Azmon the border turns to Egypt's Brook, ending at the Sea. ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
6 "Your western border will be the Mediterranean Sea and its coast. Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
7 "This will be your north border: from the Mediterranean Sea draw your line to Mount Hor. Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.
8 From Mount Hor mark a line to Lebo-hamath, ending at Zedad; Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad,
9 then the border will extend to Ziphron and end at Hazar-enan. This will be your northern border. ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
10 "You will mark out your eastern border from Hazar-enan to Shepham. Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.
11 The border will go down from Shepham to Riblah, east of Ain, then go down and reach the slope east of the Sea of Chinnereth. Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili.
12 The border goes down to the Jordan, ending at the Dead Sea. This will be your land, with its borders all around." Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ”
13 Moses commanded the Israelites: This is the land you will inherit by lot, which our Father commanded to give to the nine tribes and the half-tribe. Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.
14 The tribe of Reuben's sons, by their fathers' houses, and the tribe of Gad's sons, by their fathers' houses, have already taken their inheritance; so has the half-tribe of Manasseh. Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.
15 The two and a half tribes received their inheritance across the Jordan from Jericho, eastward toward the sunrise. Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
16 And our Father spoke to Moses, saying, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
17 "names of the men who will divide the land for you as inheritance: Eleazar the priest and Joshua son of Nun. “Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
18 And you will take one leader from each tribe to divide the land for inheritance. Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
19 These are the names of the men: from the tribe of Judah, Caleb the son of Jephunneh; “Ndị a bụ aha ndị a họpụtara: “Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
20 from the tribe of the sons of Simeon, Shemuel the son of Ammihud; Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
21 from the tribe of Benjamin, Elidad the son of Chislon; Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
22 from the tribe of the sons of Dan, a leader, Bukki the son of Jogli; Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
23 from Joseph's sons: from Manasseh's tribe, leader Hanniel son of Ephod, Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
24 and from the tribe of the sons of Ephraim, a leader, Kemuel the son of Shiphtan; Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
25 from the tribe of the sons of Zebulun, a leader, Elizaphan the son of Parnach; Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
26 from the tribe of the sons of Issachar, a leader, Paltiel the son of Azzan; Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
27 from the tribe of the sons of Asher, a leader, Ahihud the son of Shelomi; Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
28 and from the tribe of the sons of Naphtali, a leader, Pedahel the son of Ammihud." Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
29 These are the ones our Father commanded to divide the inheritance among the children of Israel in the land of Canaan. Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]