Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 35 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses on the plains of Moab by the Jordan across from Jericho: Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Command the Israelites to give the Levites, from the inheritance they hold, cities to live in, and pastureland around them, for the Levites. “Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.
3 The cities are theirs to live in; the pasturelands are for their cattle, livestock, and all their living creatures. Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
4 "The pasturelands of the cities you give the Levites reach about 1,500 feet out from the city wall on every side. “Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla.
5 Measure outside the city: about 3,000 feet on the east side, 3,000 on the south side, 3,000 on the west side, 3,000 on the north side, with the city in the middle. This is the pastureland for their cities. Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
6 "Of the cities you give the Levites, six are to be cities of refuge, for a killer to flee to; besides these, give forty-two cities. “Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
7 "All the cities that you give the Levites are to be forty-eight cities, together with their pasturelands. Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.
8 From Israel's territory, give the Levites cities—more from large tribes, fewer from small; each gives in proportion to the inheritance it received." Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
9 Our Father spoke to Moses: Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
10 "Speak to the Israelites and tell them: When you cross the Jordan into the land of Canaan, “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,
11 choose cities for yourselves, cities of refuge, where anyone who kills a person unintentionally may flee there. họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.
12 These cities are a refuge for you from the blood avenger, so the killer won't die until standing before the assembly for judgment. Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.
13 The cities you give are to be six cities of refuge for you. Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.
14 Give three cities beyond the Jordan and three cities in the land of Canaan; they are to be cities of refuge. Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.
15 These six cities are a refuge for Israelites, the foreigner, and the temporary resident among them, so anyone who kills a person by accident may flee there. Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.
16 "But if someone strikes another with an iron object and the victim dies, the attacker is a murderer—the murderer must be put to death. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya.
17 If he struck him with a stone in his hand that could kill, and he died, he is a murderer; the murderer must be put to death. A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ.
18 Or if he struck him with a deadly wooden tool in hand, and he died, he is a murderer; the murderer must be put to death. A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ.
19 The avenger of blood is to kill the murderer himself; when he meets him, he is to kill him. Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya.
20 If he pushed him from hatred, or threw something at him in ambush, so he died, Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ,
21 or if he struck him with his hand out of hatred and he died, the striker must be put to death—he is a murderer. The avenger of blood is to kill the murderer when he finds him. maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya.
22 "But if he shoved him suddenly without hostility, or threw anything at him without ambush, “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,
23 or, without seeing him, dropped on him a stone able to kill, and he died—not his enemy, not seeking his harm, maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ,
24 then the assembly is to judge between the slayer and the avenger of blood according to these rules. mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị.
25 The assembly must rescue the killer from the blood avenger's hand and return him to the city of refuge he fled to; he must stay there until the high priest anointed with holy oil dies. Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.
26 "But if the killer ever leaves the border of his refuge city, where he fled, “ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa,
27 if the avenger of blood finds him outside his city of refuge's border and kills the killer, he incurs no bloodguilt. na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya.
28 The killer must stay in his city of refuge until the high priest dies; only after the high priest's death may he return to his own land. Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya.
29 These are to be a permanent law for you throughout your generations, in every place where you live. “ ‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile.
30 "Anyone who kills a person is to be executed as a murderer, on witnesses' testimony; one witness alone cannot testify against a person to cause death. “ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya.
31 "Take no ransom for a murderer's life who deserves death—he must be executed. “ ‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ.
32 Take no ransom for someone who fled to his city of refuge, letting him return to live in the land before the priest dies. “ ‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ.
33 "Don't pollute the land you live in—blood pollutes the land, and the land can have no atonement for blood shed on it except by the blood of the one who shed it. “ ‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ.
34 Don't make the land unclean—you live there, and I live among you; for I, your Father, live among Israel's people." Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ Onyenwe anyị bi nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]