Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 36 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The family heads of Gilead's clan—descendants of Machir son of Manasseh, from Joseph's clans—approached and spoke before Moses and the leaders, heads of Israel's family clans. Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:
2 They said, "Our Father commanded my lord to give the land as an inheritance by lot to Israel's people, and my lord was commanded by our Father to give our brother Zelophehad's inheritance to his daughters. “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.
3 If they marry men from other Israelite tribes, their inheritance will be removed from our fathers' inheritance and added to their new tribe's, shrinking our allotted inheritance. Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.
4 When Israel's jubilee comes, their inheritance joins the inheritance of the tribe they marry into, taken from our fathers' tribe's inheritance." Mgbe afọ inwere onwe nye Izrel ruru, a ga-agụnye ihe nketa ha nʼebo ebe ha lụrụ dị. A ga-esi otu a wepụ ala ha site nʼihe nketa nke nna nna anyị ha ketara.”
5 So Moses commanded the Israelites at our Father's word, saying, "The tribe of Joseph speaks rightly. Mgbe ahụ, Mosis nyere ndị Izrel ntụziaka site nʼiwu Onyenwe anyị sị, “Ihe ndị ikom ebo Josef na-ekwu ziri ezi.
6 This is what our Father commands about Zelophehad's daughters: they may marry whoever they think best, only within their father's tribal clan. Ma nke a bụ iwu Onyenwe anyị na-enye maka ụmụ ndị inyom Zelofehad. Ha nwere ike ịlụ onye ọbụla masịrị ha, ma onye ha ga-alụ ga-abụrịrị onye si nʼagbụrụ ebo nna ha.
7 No Israelite inheritance may pass from tribe to tribe; each Israelite must keep their ancestral tribe's inheritance. O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha.
8 Every daughter who inherits in an Israelite tribe must marry within her father's tribal clan, so every Israelite keeps his ancestral inheritance. Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.
9 No inheritance may pass from one tribe to another; each tribe of Israel must hold to its own inheritance." Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”
10 Just as our Father commanded Moses, so the daughters of Zelophehad did. Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
11 Mahlah, Tirzah, Hoglah, Milcah, and Noah, the daughters of Zelophehad, married their cousins on their father's side. Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.
12 They married into the clans of Manasseh son of Joseph's descendants, and their inheritance stayed in their father's tribal clan. Ha lụrụ di nʼagbụrụ ụmụ Manase, nwa Josef. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa ha dịgidere nʼebo na agbụrụ nna ha.
13 These are the commands and rulings our Father commanded through Moses to Israel's people on the plains of Moab, by the Jordan at Jericho. Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị sitere nʼaka Mosis nye ndị Izrel nʼoge ha nọ nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]