Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 30 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Moses told Israel's tribal heads: This is what our Father commanded. Mosis kpọkọtara ndị ndu ebo Izrel niile gwa ha sị: “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu:
2 When a man vows a vow to our Father, or swears an oath binding himself with a pledge, he must not break his word; he must do all his mouth has spoken. Mgbe nwoke ọbụla kwere Onyenwe anyị nkwa, maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla, ọ gaghị emebi nkwa dị otu a. Kama ọ ga-emezu ihe niile dịka o kwuru ya.
3 If a woman vows a vow to our Father and binds herself by a pledge while young, living in her father's house, “Ọ bụrụ na nwaagbọghọ nọ nʼụlọ nna ya ekwe Onyenwe anyị nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla,
4 when her father hears her vow and pledge binding her, and says nothing to her, all her vows and every pledge binding her stand. ọ bụrụ na nna ya anụ mgbe ọ na-ekwe nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ahụ, ma gba ya nkịtị, onye dị otu a aghaghị imezu nkwa niile ndị ahụ o kwere.
5 But if her father forbids her the day he hears, none of her vows or bonds she bound herself with will stand; our Father will forgive her, because her father forbade her. Ma ọ bụrụ na nna ya ajụ mgbe ọ nụrụ banyere ya na ọ gaghị emezu nkwa dị otu ahụ, mgbe ahụ, nkwa ahụ maọbụ iyi ọ ṅụrụ ga-abụ ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya, nʼihi na nna ya jụrụ na ọ ga-emezu nkwa ya.
6 If she marries while under her vows, or under a rash promise she has made, “Ọ bụrụ na o mesịa lụọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị iyi, maọbụ kwee nkwa nzuzu o kwesiri imezu,
7 and her husband hears of it and stays silent to her on the day he hears, her vows stand, and the bonds she bound herself with stand. di ya nụ banyere ya ma gba ya nkịtị nʼụbọchị ahụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ ga-eguzogide, ọ ga-emezu ya.
8 But if her husband forbids her the day he hears, he cancels the vow binding her and the rash promise she made; and our Father will forgive her. Ma ọ bụrụ na di ya ajụ ịnabata nkwa ahụ, maọbụ ọṅụṅụ iyi nzuzu ahụ, ọjụjụ di ya jụrụ nkwa ahụ ga-eme ka iyi ahụ maọbụ nkwa ahụ ghara ịdị ire. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.
9 But a widow's or divorced woman's vow—everything she bound herself to—stands against her. “Ma nkwa ọbụla nke nwanyị di ya nwụrụ maọbụ nwanyị ya na di ya kewara, ihe ọbụla nke o ji ọnụ ya kwuo ka ọ ghaghị imezu.
10 If she vowed in her husband's house, or bound herself by a pledge under oath, “Ma ọ bụrụ na nwanyị ya na di ya bi e kwee nkwa maọbụ site na kwagide ṅụọ iyi,
11 and her husband heard it, said nothing to her, and did not forbid her—so all her vows stand, and every pledge by which she bound herself stands. di ya nụ ihe banyere ya, ma gba nkịtị maọbụ ogbochighị ya, mgbe ahụ, ịṅụ iyi na nkwa ndị ahụ niile nke o kwere ga-eguzo.
12 But if her husband nullifies them the day he hears, nothing she said—her vows or the pledge binding her—will stand: he has nullified them, and our Father will forgive her. Ma ọ bụrụ na di ya jụrụ ikwenye ka nkwa ahụ dịgide nʼụbọchị mbụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ maọbụ ọṅụṅụ iyi ahụ aghọọla ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.
13 Any vow and any binding oath to humble herself, her husband may confirm or nullify it. Ya mere, di ya nwere ike ịjụ, maọbụ mesie nkwa ahụ, maọbụ iyi ahụ ọ ṅụrụ ike.
14 But if her husband stays silent to her from day to day, he confirms all her vows or obligations binding her; he confirms them, because he stayed silent to her on the day he heard them. Ọ bụrụ na di ya ekwughị ihe ọbụla site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị ọzọ, mgbe ahụ, o gosiri na o kwenyere ka nwunye ya mezuo nkwa maọbụ iyi ndị ahụ niile.
15 But if he nullifies them after he has heard them, then he will bear her guilt. Ọ bụrụ na o mesịa jụ na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ ọ kwere, ikpe ọmụma niile dị nʼihi emezughị nkwa ahụ dị ya nʼisi.”
16 These are the rules our Father commanded Moses, between a man and his wife, between a father and his young daughter still in his house. Ndị a bụ usoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis banyere mmekọrịta nke nwoke na nwunye ya. Ọ metụtakwara nna na nwa ya nwanyị onye bi nʼụlọ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]