Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 31 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father said to Moses, Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Avenge the Israelites against the Midianites; afterward you will be gathered to your people." “Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”
3 So Moses told the people, "Arm men from among you for war, to go against Midian and carry out our Father's justice on Midian. Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.
4 You are to send 1,000 from each of the tribes of Israel to the war." Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.”
5 So from Israel's thousands, 1,000 per tribe were supplied—12,000 armed for war. Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.
6 Moses sent them to war, 1,000 from each tribe, with Phinehas son of Eleazar the priest, carrying the holy articles of the sanctuary and the signal trumpets in his hand. Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ.
7 They waged war against Midian, as our Father had commanded Moses, and they killed every male. Ha busoro ndị Midia agha dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke.
8 They killed the kings of Midian among the slain—Evi, Rekem, Zur, Hur, and Reba, Midian's five kings—and killed Balaam son of Beor with the sword. Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa.
9 The people of Israel captured Midian's women and children, and plundered all their livestock, flocks, and goods. Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha.
10 They burned with fire all the cities where they lived and all their camps, Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.
11 and they took all the spoil and all the plunder, both people and animals. Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.
12 They brought the captives, plunder, and spoil to Moses, Eleazar the priest, and Israel's whole assembly, at the camp on Moab's plains by the Jordan, across from Jericho. Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.
13 Moses, Eleazar the priest, and all the assembly's leaders went to meet them outside the camp. Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
14 But Moses was angry with the army's officers, commanders of thousands and commanders of hundreds, who returned from the battle. Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.
15 Moses said to them, "Have you let all the women live? Mosis jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji debe ndị inyom niile ndị a ndụ?
16 Look, these women, on Balaam's advice, led Israel to betray our Father in the Peor incident, bringing the plague on the congregation of our Father. Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke Onyenwe anyị.
17 Now kill every male child, and kill every woman who has slept with a man. Ugbu a, gbuonụ ụmụnta ndị nwoke niile, na ndị inyom niile matarala nwoke.
18 But keep alive for yourselves every young girl who has not slept with a man. Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a.
19 Stay outside the camp seven days. Anyone who killed someone or touched a corpse must purify themselves on the third day and the seventh—you and your captives. “Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa.
20 Purify every garment, every leather article, everything made of goats' hair, and every wood article." Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.”
21 Eleazar the priest told the soldiers who had gone to war, "This is the statute of the law our Father commanded Moses: Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
22 only the gold, the silver, the bronze, the iron, the tin, and the lead. Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu,
23 Everything that can withstand fire, pass through the fire—it becomes clean. But it must also be purified with water of purification. Whatever can't withstand fire, pass through the water. na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.
24 Wash your clothes on the seventh day, and you'll be clean; then you may enter the camp." Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”
25 Our Father said to Moses, Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
26 "You, Eleazar the priest, and the family heads of the community, count the plunder taken, people and animals. “Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.
27 Divide the plunder into two: between the fighters who went to battle and the whole congregation. Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.
28 From the soldiers who went out to battle, take a tax for me: one in 500—people, cattle, donkeys, and flocks. Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.
29 Take it from their half and give it to Eleazar the priest as a contribution to me. Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.
30 From the Israelites' half, take one in fifty—from the people, cattle, donkeys, flocks, and all the animals—and give them to the Levites who keep charge of my tabernacle." Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ oke nke ha.”
31 Moses and Eleazar the priest did as our Father had commanded Moses. Ya mere, Mosis na Elieza onye nchụaja mere dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu.
32 The plunder remaining from the spoil that the army had taken was 675,000 sheep, Ihe nweta bụ nke fọdụrụ nʼihe ndị agha lụtara nʼagha bụ ndị a, bụ atụrụ dị narị puku isii, iri puku asaa na puku ise (675,000),
33 72,000 cattle, Ehi dị iri puku asaa na puku abụọ (72,000),
34 61,000 donkeys, ịnyịnya ibu dị iri puku isii na otu puku (61,000),
35 and 32,000 persons in all—the women who had not slept with a man. Ụmụ agbọghọ na-amatabeghị nwoke dị iri puku atọ na puku abụọ (32,000).
36 The half belonging to those who had gone out to war numbered 337,500 sheep, Ya mere, ọkara e nyere ndị gara lụọ agha dị: Igwe ewu na atụrụ dị narị puku atọ na iri puku atọ na puku asaa na narị ise (337,500).
37 and the tribute to our Father from the sheep was 675. Nʼime ya, ụtụ e nyere Onyenwe anyị site nʼigwe atụrụ ahụ dị narị isii na iri asaa na ise (675).
38 The cattle were 36,000, of which the tribute to our Father was 72. Igwe ehi dị iri puku atọ na puku isii (36,000). Nʼime ya, ihe e nyere Onyenwe anyị bụ iri asaa na abụọ (72).
39 The donkeys were 30,500, of which the tribute to our Father was 61. Ịnyịnya ibu dị iri puku atọ na narị ise (30,500). Nke e nyere Onyenwe anyị bụ iri isii na otu (61).
40 The persons were 16,000, of which the tribute to our Father was 32. Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ dị puku iri na isii (16,000). Ndị e nyere Onyenwe anyị dị iri atọ na abụọ (32).
41 Moses gave the tribute, our Father's contribution, to Eleazar the priest, as our Father commanded him. Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja Onyenwe anyị oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
42 As for the Israelites' half, which Moses had set apart from that of the men who fought, Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha.
43 the congregation's half was 337,500 sheep, Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise (337,500),
44 36,000 cattle, igwe ehi, iri puku atọ na isii (36,000),
45 30,500 donkeys, ịnyịnya ibu, iri puku atọ na narị ise (30,500),
46 and 16,000 persons. ụmụ agbọghọ, puku iri na isii (16,000).
47 From the Israelites' half, Moses took one of every fifty—people and animals—and gave them to the Levites in charge of our Father's tabernacle, as our Father had commanded Moses. Site nʼoke ndị Izrel Mosis họpụtara otu ụzọ nʼime iri ise, ma mmadụ ma anụ ụlọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. O nyere ha ndị Livayị na-elekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị mmadụ na anụ ụlọ ndị a.
48 The officers over the army's units, the commanders of thousands and hundreds, came to Moses, Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis,
49 and said to him, "Your servants counted the fighting men under our command; not one of us is missing. sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ.
50 So we've brought our Father an offering—each man's find: gold articles, armlets, bracelets, signet rings, earrings, beads—to atone for ourselves before our Father." Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”
51 Moses and Eleazar the priest received from them the gold, all the crafted articles. Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.
52 All the gold of the contribution that they presented to our Father, from the commanders of thousands and the commanders of hundreds, came to about 420 pounds. Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.
53 The men of war had each taken plunder for himself. Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.
54 Moses and Eleazar the priest took the gold from the commanders of thousands and hundreds and brought it into the tent of meeting as a reminder for the Israelites before our Father. Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị a dị iche site nʼaka ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha na narị ndị agha. E webatara onyinye ndị a nʼụlọ nzute, debe ha nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe ncheta nye Onyenwe anyị nʼihi ndị Izrel niile.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]