Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 32 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The sons of Reuben and sons of Gad had vast herds of livestock. Seeing the land of Jazer and land of Gilead, they noticed it suited livestock well. Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.
2 The sons of Gad and sons of Reuben came and said to Moses, to Eleazar the priest, and to the community's leaders: Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,
3 "Ataroth, Dibon, Jazer, Nimrah, Heshbon, Elealeh, Sebam, Nebo, and Beon, “Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,
4 the land our Father struck down before Israel's community—is land for livestock, and your servants have livestock." bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.
5 They said, "If we have found favor in your eyes, give this land to your servants as a possession. Don't make us cross the Jordan." Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị Izrel gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan.”
6 Moses said to the sons of Gad and Reuben, "Should your brothers go to war while you sit here? Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?
7 Why discourage Israel from crossing into the land our Father has given them? Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha?
8 This is what your fathers did when I sent them from Kadesh-barnea to see the land. Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.
9 They went up to the Valley of Eshcol, saw the land, then discouraged the Israelites' hearts from entering the land our Father had given them. Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.
10 And our Father's anger burned that day, and he swore an oath, saying, Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
11 surely the men who came up from Egypt, twenty years old and up, will not see the land I swore to give to Abraham, to Isaac, and to Jacob—because they did not fully follow me. ‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’
12 None but Caleb son of Jephunneh the Kenizzite and Joshua son of Nun, for they fully followed our Father. Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz, na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
13 The anger of our Father burned against Israel; he made them wander the wilderness forty years until the whole generation that had done evil before our Father had died. Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
14 Now you have risen up in place of your fathers, a brood of sinners, adding still more to our Father's fierce anger against Israel! “Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.
15 If you turn from following him, he will leave them in the wilderness once again, and you will destroy all this people." Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”
16 They came to him and said, "We'll build pens here for our livestock and cities for our children. Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ.
17 But we will arm ourselves, ready to go ahead of the Israelites until we bring them to their place, while our children stay in fortified cities, safe from those living in the land. Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.
18 We will not return home until every Israelite has taken his inheritance. Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.
19 We won't inherit with them across the Jordan and beyond, since our inheritance has come to us on this side of the Jordan, to the east." Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”
20 Moses said to them, "If you do this—if you arm yourselves before our Father for the war, Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.
21 and every armed man among you crosses the Jordan before our Father until he drives out his enemies from before him, Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
22 and the land is subdued before our Father, afterward you may return and be free of obligation to him and to Israel, and this land will be your possession before our Father. mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
23 But if you don't do this, look—you will have sinned against our Father, and know: your sin will overtake you. “Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
24 Build cities for your little ones, pens for your flocks, and do what your mouth has promised." Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
25 The sons of Gad and Reuben said to Moses, "Your servants will do as my lord commands. Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
26 Our children, wives, flocks, and all our herds will stay there in the cities of Gilead, Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
27 but your servants, every man armed for war, will cross before our Father to battle, as my lord says." Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
28 So Moses commanded Eleazar the priest, Joshua son of Nun, and the clan leaders of Israel's tribes about them. Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha,
29 Moses said to them, "If Gad's and Reuben's sons cross the Jordan with you, every man armed for battle before our Father, and the land is subdued before you, then give them Gilead as their possession. Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.
30 But if they won't cross over armed with you, they must take possession among you in the land of Canaan." Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala Kenan.”
31 Gad's and Reuben's sons answered, "We will do as our Father told your servants. Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.
32 We ourselves will cross armed before our Father into the land of Canaan, and our inherited possession will remain ours beyond the Jordan." Anyị ga-ejikere soro Onyenwe anyị jee agha nʼala Kenan. Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọdan.”
33 Moses gave to them—the sons of Gad, the sons of Reuben, and the half-tribe of Manasseh son of Joseph—the kingdom of Sihon king of the Amorites and the kingdom of Og king of Bashan: the land, its cities, the territories, and the cities of the country around. Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.
34 And the sons of Gad built Dibon, Ataroth, Aroer, Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea
35 Atroth-shophan, Jazer, Jogbehah, Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha,
36 Beth-nimrah, and Beth-haran—fortified cities and pens for sheep. Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya.
37 And the sons of Reuben built Heshbon, Elealeh, Kiriathaim, Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem,
38 Nebo, Baal-meon (renamed), and Sibmah—they gave the cities they rebuilt new names. Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
39 Sons of Machir son of Manasseh went to Gilead, captured it, and drove out the Amorites living there. Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
40 So Moses gave Gilead to Machir son of Manasseh, and he settled in it. Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
41 And Jair son of Manasseh went and captured their villages, and called them Havvoth-jair. Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa.
42 And Nobah went and captured Kenath and its villages, and called it Nobah, after his own name. Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]