Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 29 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "In the seventh month, on the first day, hold a holy assembly. Do no ordinary work; it is a day for you to sound the trumpets. “ ‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
2 Offer a burnt offering, a pleasing aroma to our Father: one young bull, one ram, seven male lambs a year old, all without defect. Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.
3 Their grain offering: fine flour mixed with oil—about six quarts for the bull, about four quarts for the ram, Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
4 and about two quarts for each of the seven lambs; na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
5 and one male goat as a sin offering, to make atonement for you. Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
6 Besides the new-moon burnt offering and its grain offering, the daily burnt offering and its grain offering, and their drink offerings, by their rule—a soothing aroma, a fire offering to our Father. Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
7 "On the tenth day of this seventh month, hold a sacred gathering and practice self-denial; do no work at all. “ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.
8 Present a burnt offering to our Father as a pleasing aroma: one young bull, one ram, and seven male lambs a year old, all without blemish. Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.
9 Their grain offering: fine flour mixed with oil—about six quarts for the bull, about four quarts for the one ram, Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,
10 and about two quarts for each of the seven lambs; jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
11 also one male goat as a sin offering, besides the atonement sin offering, the regular burnt offering, its grain offering, and their drink offerings. Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
12 "On the fifteenth day of the seventh month, hold a holy assembly. Do no ordinary work; celebrate a feast to our Father for seven days. “ ‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.
13 Present a burnt offering, a fire offering, a pleasing aroma to our Father: thirteen young bulls, two rams, fourteen male lambs a year old, all without defect. Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.
14 Their grain offering: fine flour mixed with oil—about six quarts for each of the thirteen bulls, about four quarts for each of the two rams, A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ,
15 and about two quarts for each of the fourteen lambs; ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
16 and one male goat as a sin offering, besides the daily burnt offering, its grain offering, and its drink offering. Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
17 "On the second day: twelve young bulls, two rams, fourteen year-old male lambs, all without defect, “ ‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
18 with their grain and drink offerings for the bulls, the rams, and the lambs, by number, as required; Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
19 also one male goat as a sin offering, besides the regular burnt offering, its grain offering, and their drink offerings. Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
20 "On the third day: eleven bulls, two rams, fourteen year-old male lambs, all without defect, “ ‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
21 with their grain and drink offerings for the bulls, rams, and lambs, by number, as required. Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
22 One male goat as a sin offering, besides the regular burnt offering with its grain and drink offerings. Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
23 "Fourth day: ten bulls, two rams, fourteen year-old male lambs, all without defect, “ ‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
24 with grain and drink offerings for the bulls, rams, and lambs, by their number, as required; Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
25 plus one male goat as a sin offering, besides the daily burnt offering with its grain and drink offerings. Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
26 "On the fifth day: nine bulls, two rams, fourteen year-old male lambs, all without defect, “ ‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
27 with grain and drink offerings for the bulls, rams, and lambs, by number, as required. Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
28 Also one male goat as a sin offering, besides the continual burnt offering, its grain offering, and its drink offering. Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
29 "Sixth day: eight bulls, two rams, fourteen year-old male lambs, all without defect, “ ‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
30 with their grain offering and drink offerings for the bulls, rams, and lambs, by number, as required; Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
31 and one male goat as a sin offering, besides the regular burnt offering, its grain offering, and its drink offerings. Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
32 "On the seventh day: seven bulls, two rams, fourteen year-old male lambs, all without defect, “ ‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
33 with their grain and drink offerings for the bulls, rams, and lambs, by number, as prescribed; Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
34 and one male goat as a sin offering, besides the daily burnt offering, its grain offering and its drink offering. Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
35 "On the eighth day, hold a closing assembly; do no laborious work. “ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
36 Present a burnt offering, a fire offering, a pleasing aroma to our Father: one bull, one ram, seven male lambs a year old, all without defect, Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.
37 with their grain and drink offerings for the bull, ram, and lambs, by number, as prescribed. Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
38 One male goat for a sin offering, besides the continual burnt offering, its grain offering and its drink offering. Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
39 "Offer these to our Father at your appointed feasts, besides your vow and voluntary offerings—whether burnt, grain, drink, or peace offerings." “ ‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’ ”
40 Moses told the Israelites everything, just as our Father had commanded Moses. Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]