Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Command the Israelites, say to them: Be sure to present my offering, my food for my food offerings, a pleasing aroma to me, at its set time. “Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’
3 Say to them: This is the food offering you are to present to me: two flawless year-old lambs daily, a regular burnt offering. Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
4 Offer one lamb in the morning, the second lamb at twilight, Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.
5 with about two quarts of fine flour for a grain offering, mixed with about one quart of pressed oil. Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka.
6 A regular burnt offering, ordained at Mount Sinai for a pleasing aroma, a food offering to me. Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ Onyenwe anyị nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye Onyenwe anyị.
7 Its drink offering is a quart for each lamb; pour it out to me in the holy place as strong drink. Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị.
8 Offer the second lamb at twilight, with a grain offering and drink offering like the morning's, a food offering, a pleasing aroma to me. Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
9 "On the Sabbath, offer two flawless year-old lambs, about four quarts of fine flour mixed with oil as grain offering, plus its drink offering. “ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.
10 The burnt offering for each Sabbath, besides the regular burnt offering and its drink offering. Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha.
11 "On the first of each of your months, offer me a burnt offering: two young bulls, one ram, seven male lambs a year old, without defect, “ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
12 about six quarts of fine flour mixed with oil as a grain offering for each bull, about four quarts of fine flour mixed with oil as a grain offering for the one ram, Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
13 and two quarts of fine flour mixed with oil as a grain offering for each lamb - a burnt offering, a pleasing aroma, a food offering to me. Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.
14 Their drink offerings: two quarts of wine for the bull, just over a quart for the ram, and a quart for the lamb. This is the burnt offering for the new moon, month by month, all year. Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,
15 Offer me one male goat as a sin offering, besides the regular burnt offering and its drink offering. nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.
16 "In the first month, on the fourteenth day of the month, is the Passover to me. “ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. Onyenwe anyị.
17 On this month's fifteenth day is a feast; bread without yeast is eaten seven days. Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
18 On the first day there is to be a holy assembly; you must do no ordinary work. Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.
19 Present me a food offering, a burnt offering: two young bulls, one ram, seven yearling male lambs; see that they are without defect. Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
20 Their grain offering: fine flour mixed with oil—about six quarts for the bull, four quarts for the ram, Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara.
21 and with each of the seven lambs, about two quarts; Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, a ga-enye lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma.
22 and one male goat as a sin offering to make atonement for you. Tinye otu mkpi nʼihi ịchụ aja mmehie maka ikpuchiri unu mmehie unu.
23 Offer these in addition to the morning burnt offering, which is the regular burnt offering. A ga-achụ aja ndị a, tinyere aja ndị ọzọ niile a na-achụ nʼụbọchị niile.
24 Do this daily for seven days—food, a pleasing aroma to me—besides the regular burnt offering and its drink offering. A ga-achụ aja ndị a ụbọchị niile nʼime ụbọchị asaa nke mmemme ahụ. Ha ga-abụ aja nke isisi ha dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. A ga-achụ ha, chụkwaa aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị.
25 On the seventh day you are to hold a holy assembly; you must do no ordinary work. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
26 "On the day of firstfruits, when you bring me a new grain offering at your Feast of Weeks, hold a holy assembly; do no ordinary work. “ ‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
27 Present a burnt offering, a pleasing aroma to me: two young bulls, one ram, seven year-old male lambs. Unu ga-achụ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ka a ga-eji chụọ aja a.
28 With them comes a grain offering of fine flour mixed with oil: about six quarts for each bull, about four quarts for the one ram, Ihe unu ga-etinye nʼihe ndị a bụ aja mkpụrụ ọka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi otu oke ehi. Lita ụtụ ọka anọ na ọkara, nʼisi otu ebule,
29 and about two quarts for each of the seven lambs; na lita ụtụ ọka abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
30 with one male goat to make atonement for you. Ọzọkwa, a ga-eji otu mkpi chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
31 Offer these besides the regular burnt offering and its grain offering; see that they're flawless, with their drink offerings." Dozie aja ndị a tinyere aja ihe ọṅụṅụ ha, ya na aja nsure ọkụ na aja mkpụrụ ọka ya na aja ahụ so. Hụkwanụ na anụ ụlọ e ji chụọ aja ndị a bụ ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]