Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 27 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The daughters of Zelophehad son of Hepher, son of Gilead, son of Machir, son of Manasseh, from the clans of Manasseh son of Joseph, came forward. His daughters' names: Mahlah, Noah, Hoglah, Milcah, Tirzah. Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,
2 They stood before Moses, before Eleazar the priest, before the leaders and the whole assembly, at the tent of meeting's entrance, and said: nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,
3 "Our father died in the wilderness. He was not among those who gathered against our Father with Korah's group; he died for his own sin, and had no sons. “Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.
4 Why should our father's name disappear from his clan because he had no son? Give us property among our father's brothers." Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
5 So Moses brought their case before our Father. Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị.
6 And our Father said to Moses: Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
7 "Zelophehad's daughters are right. Give them a hereditary portion among their father's brothers, and transfer their father's inheritance to them. “Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
8 Say to the Israelites: If a man dies without a son, transfer his inheritance to his daughter. “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị.
9 If he has no daughter, you are to give his inheritance to his brothers. Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke.
10 If he has no brothers, you are to give his inheritance to his father's brothers. A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.
11 If his father has no brothers, give his inheritance to his nearest relative in his clan, who is to possess it. This is a legal statute for the Israelites, as our Father commanded Moses." Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ”
12 Then our Father said to Moses, "Go up Mount Abarim and see the land I've given the Israelites. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.
13 When you see it, you too will be gathered to your people, as Aaron your brother was gathered, Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
14 because you rebelled against my command in the wilderness of Zin, during the congregation's quarrel, to honor me as holy at the water before their eyes—the water of Meribah of Kadesh, wilderness of Zin." Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
15 Moses spoke to our Father, saying: Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
16 "May the Father of the spirits of all flesh appoint a man over the congregation, “Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
17 who goes out before them and comes in before them, who leads them out and brings them in, so our Father's assembly will not be like sheep without a shepherd." Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
18 So our Father told Moses, "Take Joshua son of Nun, a man with the Spirit of our Father in him, and lay your hand on him. Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.
19 Have him stand before Eleazar the priest and the whole assembly, and commission him before their eyes. Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.
20 Give him some of your authority, so that the whole congregation of the Israelites will obey him. Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.
21 He will stand before Eleazar the priest, who will consult the Urim's judgment for him before our Father. At Eleazar's word they will go out, at his word come in—he, all the Israelites with him, the whole congregation." Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
22 Moses obeyed our Father's command: he took Joshua and stood him before Eleazar the priest and the entire assembly. Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
23 He laid his hands on him and commissioned him, as our Father had spoken through Moses. Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]