Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 This is the family line of Aaron and Moses, when our Father spoke with Moses on Mount Sinai. Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Erọn na Mosis nʼoge Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị.
2 These are the names of the sons of Aaron: Nadab the firstborn, then Abihu, Eleazar, and Ithamar. Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, Nadab, ọkpara ya, Abihu, Elieza na Itama.
3 These are the names of Aaron's sons, the anointed priests whom Moses ordained to serve as priests. Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja.
4 Nadab and Abihu died before our Father in the wilderness of Sinai when they offered unauthorized fire before him; they had no children. So Eleazar and Ithamar served as priests before Aaron their father. Ma Onyenwe anyị mere ka Nadab na Abihu nwụọ, nʼihu ya nʼime ọzara Saịnaị, mgbe ha ji ọkụ na-adịghị nsọ wetara ya onyinye. Ebe ọ bụ na ha amụtaghị ụmụ ndị ikom nke aka ha, ọ bụ naanị Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja ogologo ụbọchị ndụ nna ha bụ Erọn.
5 Then our Father said to Moses: Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
6 "Bring the tribe of Levi near and set them before Aaron the priest, to serve him. “Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya.
7 They are to keep his duties and those of the whole community before the tent of meeting, performing the tabernacle's service. Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ.
8 They are to guard all the tent of meeting's equipment and the Israelites' duty, doing the tabernacle's service. Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ.
9 Give the Levites to Aaron and his sons; they are given entirely to him from among Israel's people. Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam.
10 Appoint Aaron and his sons to guard their priesthood; any outsider who comes near must die." Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.”
11 Then our Father said to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
12 "Look, I have taken the Levites from among the Israelites in place of every firstborn that opens the womb among the Israelites. The Levites are mine. “Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m.
13 Every firstborn is mine. The day I struck down every firstborn in Egypt, I set apart for myself every firstborn in Israel—both man and animal. They will be mine. I am your Father." Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.”
14 Then our Father spoke to Moses in the wilderness of Sinai: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya,
15 "Count Levi's sons by fathers' houses and clans; count every male a month old and up." “Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
16 So Moses counted them at the word of our Father, just as he had been commanded. Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
17 These were the sons of Levi by their names: Gershon, Kohath, and Merari. Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị: Geshọn, Kohat na Merari.
18 These are the names of the sons of Gershon by their clans: Libni and Shimei. Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị: Libni na Shimei.
19 The sons of Kohath by their clans: Amram, Izhar, Hebron, and Uzziel. Ụmụ Kohat dịka ikwu ha si dị: Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
20 Merari's sons by clan: Mahli and Mushi. These are the Levite clans by fathers' houses. Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị: Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị agbụrụ Livayị, dịka ezinaụlọ ha si dị.
21 From Gershon: the Libnite clan and the Shimeite clan—these are the Gershonite clans. Ndị Geshọn bụ ndị ikwu Libni na Shimei. Ndị a bụ ndị ikwu Geshọn.
22 The number of males counted, a month old or older, was 7,500. Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500).
23 The clans of the Gershonites camped behind the tabernacle on the west. Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute.
24 The leader of the fathers' house of the Gershonites was Eliasaph son of Lael. Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.
25 Gershon's sons at the tent of meeting cared for the tabernacle, the tent, its covering, and the entrance screen of the tent of meeting. Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute.
26 The courtyard's curtains and its entrance screen, surrounding the tabernacle and altar, and its cords for all its service. Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.
27 From Kohath came the Amramite clan, the Izharite clan, the Hebronite clan, and the Uzzielite clan; these are the clans of the Kohathites. Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat.
28 Males a month old and up numbered 8,600, in charge of the sanctuary. Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.
29 The clans of the sons of Kohath camped on the south side of the tabernacle. Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.
30 The leader of the fathers' house of the Kohathite clans was Elizaphan son of Uzziel. Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.
31 They cared for the ark, the table, the lampstand, the altars, the sanctuary vessels used in service, the screen, and all its work. Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi.
32 Eleazar son of Aaron the priest was chief leader of the Levites, in charge of those guarding the sanctuary. Onyeisi ndị ndu nke ndị Livayị bụ Elieza nwa Erọn, onye nchụaja. Ọ bụ ya na-elekọta ndị ọrụ ha bụ ihu maka ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ.
33 From Merari: the Mahlite clan and the Mushite clan—these are Merari's clans. Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari.
34 The number of males counted, a month old or older, was 6,200. Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku isii na narị abụọ (6,200).
35 Leader of Merarite clans' ancestral house: Zuriel son of Abihail; they camped on the tabernacle's north side. Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ.
36 Merari's sons were charged with the tabernacle's frames, crossbars, posts, bases, all its equipment, and all its service, Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha.
37 as well as the posts of the surrounding courtyard with their bases, pegs, and cords. Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile.
38 Camped east of the tabernacle, in front of the tent of meeting toward sunrise, were Moses, Aaron, and his sons, who kept charge of the sanctuary for the Israelites; any outsider who approached was to be put to death. Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom. Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile. Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu.
39 All the Levites whom Moses and Aaron counted at our Father's command, by their clans, every male a month old and up: 22,000. Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.
40 Then our Father said to Moses, "Count every firstborn male of Israel a month old or older, and record the number of their names. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ.
41 Take the Levites for me—I am your Father—in place of every firstborn among the people of Israel, and the Levites' livestock in place of every firstborn among Israel's livestock." Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m Onyenwe anyị.”
42 So Moses counted every firstborn among the people of Israel, just as our Father had commanded him. Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu,
43 All firstborn males, a month or older, listed by name: 22,273. chọpụta na ọnụọgụgụ ndị ikom e buru ụzọ mụọ site nʼonye dị otu ọnwa ruo nʼokenye dị iri puku abụọ na puku abụọ na narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273).
44 Then our Father spoke to Moses: Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị:
45 "Take the Levites instead of every firstborn among Israel's people, and the Levites' livestock instead of theirs. The Levites will be mine. I am your Father. “Nye m ndị Livayị nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Nyekwa m anụ ụlọ ndị Livayị niile nʼọnọdụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ndị Livayị bụ nke m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
46 To redeem the 273 firstborn Israelites exceeding the Levites' count. Ihe a ga-eji gbara narị ụmụ ndị ikom Izrel abụọ na iri ndị ikom asaa, na atọ (273) ndị e buru ụzọ mụọ mapụtara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị
47 Collect about 2 ounces per person, by sanctuary standard (each measure about half an ounce of silver). bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ.
48 Give the money to Aaron and his sons as the redemption price for the extra firstborn sons." Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.”
49 So Moses collected the redemption money from the firstborn sons who exceeded the number of the Levites; Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị.
50 from Israel's firstborn sons he took 1,365—about 2 ounces, by the sanctuary standard. Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise (1,365), dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị.
51 Moses gave the redemption money to Aaron and his sons, by our Father's word, just as our Father commanded Moses. Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]