Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses and Aaron, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
2 "Count the Kohathites among the Levites, by clan and ancestral house. “Gụọ ọnụ chọpụta, ọnụọgụgụ ụmụ Kohat dị nʼebo Livayị dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
3 From thirty to fifty years old, all who enter the service to work in the tent of meeting. Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute.
4 "This is the service of Kohath's sons in the tent of meeting: the most holy things. “Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ.
5 When the camp moves, Aaron and his sons take down the screening curtain and cover the ark of the testimony with it. Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
6 They are to cover it with fine leather, spread an all-blue cloth over that, and set its poles. Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị.
7 "On the table of the Presence they'll spread a blue cloth, put the plates, dishes, bowls, and pouring jars on it; the regular bread stays on it. “Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
8 They are to spread a scarlet cloth over them, cover it with fine leather, and fit its poles. Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
9 "They will take a blue cloth, cover the lampstand of light, its lamps, tongs, trays, and all its oil vessels used to service it. “Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
10 They are to wrap it and all its vessels in fine leather and set it on the carrying frame. Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.
11 "Over the golden altar they are to spread blue cloth, cover it with fine leather, and insert its poles. “Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
12 They must take all the service utensils used in the sanctuary, put them in blue cloth, cover with fine leather, and place them on the pole. “Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.
13 "They are to remove the ashes from the altar and spread a purple cloth over it. “A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ.
14 On it they are to put all its serving vessels—firepans, forks, shovels, basins, all the altar's vessels—then spread over it a fine leather covering and insert its poles. Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị.
15 "When Aaron and his sons finish covering the holy things and all vessels of the holy place, and the camp sets out, Kohath's sons come to carry them, but they must not touch the holy things or die. These are Kohath's sons' burdens in the tent of meeting. “Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.
16 "Eleazar son of Aaron the priest is responsible for the lamp oil, fragrant incense, daily grain offering, and anointing oil—responsible for the whole tabernacle, everything in it, the sanctuary and its furnishings." “Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.”
17 Our Father spoke to Moses and Aaron, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
18 "Do not let the tribe of the Kohathite clans be cut off from among the Levites. “Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị.
19 Do this for them so they live and not die when they approach the most holy things: Aaron and his sons must enter, assigning each his task and burden. Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu.
20 But they must not go in and look at the holy things, even for a moment, or they will die." Ma ndị Kohat ekwesighị ịbanye ilekwasị ihe nsọ ndị ahụ anya, ka ha ghara ịnwụ.”
21 Our Father spoke to Moses, saying: Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
22 "Take a census of the sons of Gershon also, by their fathers' houses and their clans. “Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
23 Count those thirty to fifty years old who serve, doing work at the tent of meeting. Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise.
24 "This is the service of the clans of the Gershonites, in serving and in carrying: “Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu.
25 They carry the tabernacle's curtains, the tent of meeting, its covering, the fine-leather covering over it, and the screen for the tent of meeting's entrance, Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
26 the courtyard curtains, the entrance screen for the courtyard gate, surrounding tabernacle and altar, their cords, and all their service equipment—they are to do whatever these need. Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.
27 Aaron and his sons direct all the Gershonites' service—their carrying and duties; assign them all they must carry. Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu.
28 This is the service of the Gershonite clans at the tent of meeting, their duty under Ithamar son of Aaron the priest. Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.
29 "As for the sons of Merari, you are to count them by their clans and their fathers' houses. “Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
30 Count everyone thirty to fifty years old who enters the service to work at the tent of meeting. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.
31 This is their task, their service at the meeting tent: the frames, bars, posts, and bases of the tabernacle. Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile;
32 The courtyard's pillars all around, with their bases, pegs, and cords, all their equipment and service—assign by name what each must carry. tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.
33 This is the Merarite clans' service in the Tent of Meeting, under Ithamar son of Aaron the priest." Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.”
34 So Moses, Aaron, and the leaders of the congregation counted the sons of the Kohathites by their clans and their families, Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
35 thirty to fifty years old, all who joined the service for work in the tent of meeting. Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute ahụ
36 Those counted by their clans were 2,750. dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị asaa na iri ise (2,750).
37 The count of Kohathite clans, all who served in the tent of meeting, whom Moses and Aaron counted at our Father's command through Moses. Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Kohat ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
38 Those counted of the sons of Gershon, by their clans and their fathers' houses, A gụrụ ụmụ Geshọn ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
39 from thirty to fifty years old, all who entered service work at the tent of meeting. Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute,
40 Those counted by their clans and their fathers' houses were 2,630. dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị isii na iri atọ (2,630).
41 These were counted from the Gershonite clans, all who served in the tent of meeting, whom Moses and Aaron counted at our Father's command. Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Geshọn ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
42 Those counted of the clans of the sons of Merari, by their clans and their fathers' houses, A gụrụ ụmụ Merari ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
43 from age thirty to fifty, all who entered service for work in the tent of meeting, Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute
44 those counted by their clans were 3,200. dịka ikwu ha si dị bụ puku atọ na narị abụọ (3,200).
45 These were counted of the clans of Merari's sons, whom Moses and Aaron counted at our Father's command through Moses. Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Merari ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
46 All those whom Moses, Aaron, and Israel's leaders counted among the Levites, by clans and ancestral houses. Otu a ka Mosis na Erọn na ndị ndu ụmụ Izrel si gụọ ndị Livayị niile ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
47 From thirty to fifty years old, everyone who served and carried loads in the tent of meeting. Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ
48 Those counted were 8,580. dị puku asatọ na narị ise na iri asatọ (8,580).
49 By our Father's command, Moses appointed each to his service and burden, and counted them, as our Father commanded Moses. Dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis si dị, e kenyere onye ọbụla ọrụ ya ma gwa ya ihe o kwesiri ibu. A gụrụ ha ọnụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]