Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Command the Israelites to send from the camp everyone with a skin disease, everyone with a discharge, and everyone unclean from a corpse. “Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka.
3 Send away both male and female; send them outside the camp, so they don't make their camp unclean, where I live among them." Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.”
4 The Israelites did this, sending them outside the camp; as our Father told Moses, the Israelites did. Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
5 Then our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
6 "Tell Israel's people: When a man or woman commits any human sin, betraying me, that person is guilty. “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.
7 They must confess the sin they committed, repay in full for the wrong, add a fifth, and give it to the one they wronged. Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.
8 But if that person has no relative to receive restitution, it belongs to me and goes to the priest, plus the ram of atonement made for the guilty one. Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.
9 Every contribution among all Israel's holy gifts brought to the priest belongs to him. Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.
10 Everyone's holy gifts remain their own; what one gives the priest belongs to the priest." Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ ”
11 Then our Father spoke to Moses: Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
12 "Speak to the Israelites and tell them: If any man's wife goes astray and is unfaithful to him, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
13 if another man sleeps with her, hidden from her husband, and she goes undetected though unclean—no witness against her, not caught in the act, site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),
14 a spirit of jealousy comes over the husband, and he is jealous of his wife, who is unclean; or a spirit of jealousy comes over him, and he is jealous though she is not unclean. ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
15 The man must bring his wife to the priest, along with her offering: about two quarts of barley flour. He must pour no oil on it and put no frankincense on it, because it is a grain offering of jealousy, a grain offering of remembrance, recalling guilt. nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
16 The priest is to bring her near and set her before our Father. “ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
17 The priest is to take holy water in a clay jar, take dust from the tabernacle floor, and put it into the water. Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ.
18 The priest is to stand the woman before our Father, unbind her hair, and put in her hands the grain offering of remembrance—the jealousy offering—while he holds the bitter, curse-bringing water. Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
19 The priest is to put her under oath and say to her: 'If no man has slept with you, and you have not gone astray and made yourself unclean under your husband's authority, be free from this bitter water that brings the curse. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ.
20 But if you strayed under your husband, made yourself unclean, and a man besides your husband slept with you.' Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,”
21 Then the priest is to bind the woman by this curse-oath, saying: May the Father turn you into a curse and a disgrace among your people, as he makes your thigh shrivel and your belly swell. (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko.
22 May this curse-bringing water enter your body, swelling your belly and wasting your thigh. Then the woman must say, 'Amen, amen.' Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.” “ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”
23 "Then the priest writes these curses on a scroll and washes them off into the bitter water. “ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.
24 He is to make the woman drink the bitter, cursing water; the cursing water will enter her, causing bitter suffering. Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu.
25 The priest takes the jealousy grain offering from her hand, waves it before our Father, and brings it to the altar. Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
26 The priest takes a handful of the grain offering, its memorial portion, burns it on the altar, then makes the woman drink the water. Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.
27 After he makes her drink the water, if she has made herself unclean and betrayed her husband, the curse-bringing water will enter her, causing bitter suffering: her belly will swell, her thigh wither, and she will become a curse among her people. Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
28 But if the woman has not made herself unclean and is clean, she is cleared and will conceive children. Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
29 "This is the law of jealousy: when a wife under her husband strays and makes herself unclean, “ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.
30 or when a spirit of jealousy seizes a man and he is jealous of his wife: he is to stand her before our Father, and the priest is to apply this whole law to her. Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
31 The husband will be free from guilt, but the woman will answer for her own sin." A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]