Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "Speak to the Israelites and say to them: When a man or woman makes a special vow, a Nazirite vow, to set themselves apart to the Father. Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait,
3 They must not drink wine or strong drink, nor vinegar from either, nor any grape juice, nor eat grapes fresh or dried. ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ.
4 During their separation they must eat nothing from the grapevine, from seeds to skin. Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.
5 "During their vow of separation, no razor touches their head. Until it's complete, they stay holy to the Father; they must let their hair grow. “ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.
6 "Throughout their time of separation to the Father they must not go near a dead body. “ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ,
7 They must not make themselves unclean even for father, mother, brother, or sister when they die, since their dedication crown to our Father is on their head. ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi.
8 Throughout their time of separation they are holy to the Father. Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.
9 "If someone dies very suddenly beside them, making their dedicated head unclean, they must shave their head on the day of their cleansing—shave it on the seventh day. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha.
10 On the eighth day they must bring two turtledoves or two young pigeons to the priest at the meeting tent's entrance. Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
11 The priest must offer one as a sin offering, the other as a burnt offering, and make atonement for them, because they sinned by being near the dead body. That same day they must rededicate their head. Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ.
12 They must rededicate to the Father their days of separation and bring a year-old male lamb as a guilt offering; the earlier days don't count—their separation was made unclean. Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.
13 "This is the law of the Nazirite: when their days of separation end, they must come to the tent of meeting's entrance. “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
14 They must bring the Father their offering: one flawless year-old male lamb as a burnt offering, one flawless year-old ewe lamb as a sin offering, and one flawless ram as a peace offering, Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo,
15 with a basket of unleavened bread—loaves of fine flour mixed with oil, unleavened wafers coated with oil—plus their grain offering and drink offerings. tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
16 The priest must present them before the Father and offer the sin offering and the burnt offering. “ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ.
17 He must offer the ram as a peace offering to the Father with the basket of bread without yeast, and offer its grain and drink offerings. Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.
18 At the tent of meeting's entrance, the Nazirite must shave their dedicated head, take the hair of dedication, and put it on the fire under the peace offering. “ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
19 The priest takes the boiled ram's shoulder, one unleavened loaf and wafer from the basket, and puts them in the Nazirite's hands after the hair of dedication is shaved off. “ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ.
20 The priest waves them as a wave offering before our Father—a holy portion for the priest, with the breast that is waved and the thigh that is contributed. Then the Nazirite may drink wine. Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.
21 "This is the law of the Nazirite who vows an offering to our Father for their separation, besides whatever else they can afford. They must do according to their vow, per the law of their separation." “ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”
22 Then our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
23 "Tell Aaron and his sons: This is how you are to bless the Israelites. Say to them: “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,
24 'May your Father bless you and keep you; “ ‘ “Onyenwe anyị gọzie unu ma chebe unu,
25 may your Father make his face shine upon you and be gracious to you; Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu, ma meere unu amara,
26 may your Father look on you with favor and give you peace.' Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ, nyekwa unu udo.” ’
27 "So they will put my name on the Israelites, and I will bless them." “Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]