Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then our Father spoke to Moses and Aaron, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
2 "The Israelites are to camp, each by his standard, with banners of their ancestral houses, facing the tent of meeting all around, they are to camp. “Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
3 "To the east, toward sunrise: the camp of Judah, by their divisions, under its standard. Leader of Judah's people: Nahshon son of Amminadab. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
4 His division, those counted, numbered 74,600. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600)
5 "Camping next to him: the tribe of Issachar; the leader of Issachar's sons is Nethanel son of Zuar. Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
6 His division, those counted, numbered 54,400. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
7 "Then the tribe of Zebulun; leader of Zebulun's sons: Eliab son of Helon. Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
8 His division, those counted, numbered 57,400. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
9 "All counted in Judah's camp: 186,400, by their divisions. They set out first. Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
10 "South side: the banner of Reuben's camp, by divisions. Leader of Reuben's people: Elizur son of Shedeur. Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
11 His division, those counted, numbered 46,500. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
12 "Camping beside him: the tribe of Simeon; leader of Simeon's people, Shelumiel son of Zurishaddai. Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
13 His division, those counted, numbered 59,300. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
14 "Then the tribe of Gad: leader of Gad's people, Eliasaph son of Deuel. Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
15 His division, those counted, numbered 45,650. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).
16 "Those counted in Reuben's camp, by their divisions: 151,450. They set out second. Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
17 "Then the tent of meeting sets out, with the Levites' camp in the middle of the camps. They set out in the order they camp, each in place, under their banners. Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.
18 "West side: Ephraim's camp standard, by their divisions; leader of Ephraim's people is Elishama son of Ammihud. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
19 His division, those counted, numbered 40,500. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
20 "Beside him: the tribe of Manasseh, led by Gamaliel son of Pedahzur. Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
21 His division, those counted, numbered 32,200. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
22 "Then the tribe of Benjamin, led by Abidan son of Gideoni. Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.
23 His division, those counted, numbered 35,400. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).
24 "All counted in Ephraim's camp: 108,100, by their divisions. They set out third. Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ (108,100). Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
25 "Dan's camp standard stands on the north side, by divisions. Ahiezer son of Ammishaddai leads Dan's people. Ebo Dan na usuu ndị agha ha ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai
26 His division, those counted, numbered 62,700. Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).
27 "Camping next to it: the tribe of Asher, its leader Pagiel son of Ochran. Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran.
28 His division, those counted, numbered 41,500. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).
29 "Then the tribe of Naphtali; Naphtali's leader is Ahira son of Enan. Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.
30 His division, those counted, numbered 53,400. Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
31 "All counted in Dan's camp: 157,600. They set out last, by their standards." Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.
32 These are Israelites counted by their clans, all camp divisions: 603,550. Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ.
33 But the Levites were not counted among the Israelites, just as our Father had commanded Moses. Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
34 So the Israelites did all our Father commanded Moses. So they camped by their standards, and so they set out, each by clan, by ancestral family. Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]