Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses in the Sinai wilderness, in the tent of meeting, on the first day of the second month of the second year after they left the land of Egypt. He said: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ, nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị,
2 "Count the whole community of Israel's people, by clans and fathers' houses—every male, by name, head by head. “Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.
3 Register everyone in Israel twenty and older who can serve in the army—you and Aaron—by their divisions. Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.
4 A man from each tribe is to be with you, each one the head of his family. Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.
5 "Names of the men who will stand with you: from Reuben, Elizur son of Shedeur. “Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
6 "From Simeon, Shelumiel son of Zurishaddai; site nʼebo Simiọn, Shelumiel nwa Zurishadai,
7 "From Judah, Nahshon son of Amminadab; site nʼebo Juda, Nashọn nwa Aminadab,
8 "From Issachar, Nethanel son of Zuar; site nʼebo Isaka, Netanel nwa Zua,
9 "From Zebulun, Eliab son of Helon; site nʼebo Zebụlọn, Eliab nwa Helọn,
10 "From the sons of Joseph: from Ephraim, Elishama son of Ammihud; from Manasseh, Gamaliel son of Pedahzur; Site nʼụmụ Josef: site nʼebo Ifrem, Elishama nwa Amihud site nʼebo Manase, Gamaliel nwa Pedazo
11 "From Benjamin, Abidan son of Gideoni; site nʼebo Benjamin, Abidan nwa Gidiọn
12 "From Dan, Ahiezer son of Ammishaddai; site nʼebo Dan, Ahieza nwa Amishadai
13 "From Asher, Pagiel son of Ochran; site nʼebo Asha, Pagịel nwa Okran
14 "From Gad, Eliasaph son of Deuel; site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel
15 "From Naphtali, Ahira son of Enan. site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.”
16 "These were the community's called ones, leaders of their ancestral tribes, heads of Israel's clans." Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.
17 So Moses and Aaron took these men who had been designated by name, Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.
18 on the first day of the second month they gathered the whole community. The people registered their ancestry by clan and family—every male twenty years old and older, listed by name, one by one, Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,
19 as our Father had commanded Moses. So Moses counted them in the wilderness of Sinai. dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.
20 From Reuben's descendants, Israel's firstborn: recorded by clan and family, name by name, every male twenty years old and up, able to serve in war. Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
21 Those counted from the tribe of Reuben were 46,500. Ọnụọgụgụ ndị niile si nʼebo Ruben dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
22 Simeon's descendants, by clans and families, counted by name, head by head: every male twenty years old and up, fit for the army. Site nʼụmụ Simiọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
23 Those counted from the tribe of Simeon were 59,300. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Simiọn dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
24 From Gad's descendants: by clans, families, and names, every man twenty and older fit for military service. Site nʼụmụ Gad, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
25 Those counted from the tribe of Gad were 45,650. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Gad dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).
26 Judah's descendants, listed by clans and families, by name, every man twenty and older able to serve in the army: Site nʼụmụ Juda, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
27 those counted from the tribe of Judah were 74,600. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Juda dị iri puku asaa, puku anọ na narị isii (74,600).
28 Issachar's descendants, listed by clan and family, by name, every man twenty years and older fit for war: Site nʼụmụ Isaka, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
29 those counted from the tribe of Issachar were 54,400. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Isaka dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
30 Zebulun's descendants: registered by clan and family, by name, every man twenty years old or older fit for military service. Site nʼụmụ Zebụlọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
31 Those counted from the tribe of Zebulun were 57,400. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Zebụlọn dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
32 Sons of Joseph, Ephraim's line: recorded by clan and family, by name, every man twenty and older fit for military service. Site nʼụmụ Josef, ya bụ ụmụ Ifrem, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
33 Those counted from the tribe of Ephraim were 40,500. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Ifrem dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
34 Manasseh's descendants, listed by clans and families, by name, each man twenty years or older able to serve in the army: Site nʼụmụ Manase, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
35 those counted from the tribe of Manasseh were 32,200. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Manase dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
36 From Benjamin's descendants, recorded by clan and family, by name, every man twenty years old and older, fit for military service: Site nʼụmụ Benjamin, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
37 those counted from the tribe of Benjamin were 35,400. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Benjamin dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).
38 From Dan's descendants, listed by clan and family, by name, every man twenty years old and older fit for war: Site nʼụmụ Dan, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
39 those counted from the tribe of Dan were 62,700. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Dan dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).
40 Asher's descendants, listed by clan and family, by name: every man twenty years old and up, fit for military service. Site nʼụmụ Asha, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
41 Those counted from the tribe of Asher were 41,500. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Asha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).
42 Naphtali's descendants: by clan and family, counted by name, every man twenty and older fit for war. Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
43 Those counted from the tribe of Naphtali were 53,400. Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
44 Moses, Aaron, and Israel's twelve leaders counted these men, each for his family. Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.
45 All Israel's people were counted by families, every man twenty years old and older, fit to serve in Israel's army. Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị.
46 All those counted came to 603,550. Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).
47 But the Levites were not counted among them by their ancestral tribe. A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a,
48 For our Father had said to Moses: nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
49 "Do not count the tribe of Levi or list them among the Israelites. “Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel.
50 Instead, put the Levites in charge of the tabernacle of the testimony, all its furnishings, and everything belonging to it. They must carry the tabernacle and its furnishings, care for it, and camp around it. Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.
51 When the tabernacle sets out, Levites take it down; when it is pitched, Levites set it up. Any outsider who comes near is to be put to death. Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu.
52 Israel's people are to camp, each by his own camp, each under his own banner, by their companies. Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha.
53 The Levites must camp around the tabernacle of the testimony, so no wrath falls on the Israelite community; the Levites are to guard the tabernacle of the testimony." Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.”
54 The people of Israel did everything our Father had commanded Moses; that is exactly what they did. Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]