Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 27 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Speak to Israel: When anyone makes a special vow to me, dedicating a person by their equivalent value, “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ e kwee nkwa pụrụ iche iji mmadụ nye Onyenwe anyị onyinye, ihe ndị a ka ọ ga-eji gbara onye ahụ:
3 if the valuation is for a male from twenty years old to sixty years old, the value is 1.2 pounds of silver, by the sanctuary standard. nʼisi nwoke ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii, ọ ga-akwụ iri ọlaọcha shekel ise, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị.
4 If it is a female, the valuation is to be about twelve ounces. Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ.
5 For ages five to twenty, the valuation is about eight ounces for a male and about four ounces for a female. Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri.
6 If from one month to five years old, the valuation is about two ounces of silver for a male and about one.two ounces for a female. A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ.
7 If sixty or older, the valuation is about six ounces for a male, four ounces for a female. Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri.
8 But if he is too poor for the valuation, he is to be presented before the priest, and the priest is to set his value; the priest is to value him according to what the one who vowed can afford. Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru.
9 "If the vow is an animal that may be offered to me, every such one given to me is holy. “ ‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye Onyenwe anyị dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere Onyenwe anyị ga-aghọ ihe dị nsọ.
10 He must not exchange or substitute it, good for bad or bad for good; if he does substitute one animal for another, both it and its substitute become holy. Onye kwere nkwa inye ya enweghị ike iji anụ ụlọ nke ahụ ya na-ezughị oke gbanwere anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ. O nwekwaghị ike iji anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ gbanwere nke anụ ahụ ya na-ezughị oke. Ọ bụrụ na o mee otu a, anụ ụlọ nke mbụ, na nke abụọ, ga-abụ ihe dị nsọ.
11 If it is any unclean animal that may not be offered to me, it is to be presented before the priest, Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye Onyenwe anyị, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ.
12 the priest will set its value, good or bad; as the priest values it, so it will be. Ọ bụ ya ka ọ dịrị ikpebi ma anụ ụlọ ahụ ọ dị mma, ma ọ jọrọ njọ. Ọnụ ego ọbụla onye nchụaja kpebiri, ka onye wetara anụ ụlọ ahụ ga-akwụ.
13 But if he wishes to redeem it, he is to add a fifth to its valuation. Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ.
14 "When someone dedicates his house as holy to me, the priest is to set its value, good or bad; as the priest values it, so it stands. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ.
15 If the one who dedicated his house redeems it, he adds a fifth of its value in silver, and it is his. Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya.
16 "If someone dedicates to me part of a field he owns, its value follows the seed for it—about 1.2 pounds of silver for six bushels of barley seed. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye Onyenwe anyị ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise.
17 If he dedicates his field from the Year of Jubilee, it is to stand at the full valuation. Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.
18 But if he dedicates his field after the Jubilee, the priest will figure the price by the years left until the next Jubilee, and lower the valuation to match. Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru.
19 If the one dedicating the field wants to redeem it, he must add a fifth of its silver value, and it stays his. Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.
20 But if he does not redeem the field, or has sold it to another, it can no longer be redeemed. Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ.
21 When the field is released in the Jubilee, it becomes holy to me, like a devoted field; it belongs to the priest as his property. Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha.
22 "If someone dedicates to me a bought field, not part of his ancestral possession, “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro Onyenwe anyị ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha,
23 the priest is to calculate the valuation up to the Year of Jubilee, and he is to pay it that day as something holy to me. onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
24 In the Year of Jubilee the field returns to the one it was bought from, to whom the land belongs. Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.
25 Every valuation is to be by the sanctuary standard. Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel.
26 "No one may dedicate the firstborn of any animal; it already belongs to me—whether ox or sheep, it is mine. “ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.
27 If it is an unclean animal, he redeems it at the valuation plus a fifth; if not redeemed, it is sold at the valuation. Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru.
28 "But nothing a person devotes to me by ban—a human, animal, or field he owns—may be sold or redeemed. All so devoted is most holy to me. “ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye Onyenwe anyị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.
29 "No person devoted under the ban may be redeemed; he must be put to death. “ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ.
30 "Every tithe of the land, whether of the seed of the ground or of the fruit of the trees, is mine; it is holy to me. “ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke Onyenwe anyị. Ha bụ ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
31 If anyone redeems part of his tenth, he adds a fifth to it. Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya.
32 Every tenth of the herd and flock—each animal passing under the shepherd's rod—is holy to me. Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
33 He must not check whether it is good or bad, nor substitute for it; if he does, both it and its substitute become holy and cannot be redeemed." A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye Onyenwe anyị ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’ ”
34 These are the commandments our Father gave Moses for the people of Israel on Mount Sinai. Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]