Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In those days John the Baptist came, preaching in the wilderness of Judea, Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ,
2 "Repent, for the kingdom of our Father has come near." “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
3 This is the one Isaiah the prophet spoke of, saying: "A voice calling out in the wilderness: Prepare the way of the Lord, make his paths straight." Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”
4 John wore clothes of camel hair, with a leather belt around his waist; his food was locusts and wild honey. Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
5 Then Jerusalem and all Judea and all the region around the Jordan went out to him, Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya.
6 and they were baptized by him in the Jordan River, confessing their sins. Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
7 Seeing many Pharisees and Sadducees coming to be baptized, he said to them, "You brood of vipers! Who warned you to flee the coming wrath? Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
8 Bear fruit, then, worthy of repentance. Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.
9 Don't presume to say to yourselves, 'Abraham is our father,' for I tell you: our Father can raise up children for Abraham from these stones. Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
10 The axe already lies at the root of the trees, so every tree not bearing good fruit is cut down and thrown into the fire. Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ.
11 "I baptize you with water for repentance, but the one coming after me is stronger than I am—I'm not worthy to carry his sandals. He will baptize you with the Holy Spirit and fire. “Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim.
12 His winnowing fork is in his hand; he'll clear his threshing floor, gather his wheat into the barn, but burn the chaff with fire that never goes out." Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”
13 Then Jesus came from Galilee to the Jordan to John, to be baptized by him. Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim.
14 But John tried to stop him: "I need baptism from you, yet you come to me?" Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?”
15 Jesus replied to him, "Allow it now, for this is how we must fulfill all righteousness." So John allowed him. Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere.
16 After Jesus was baptized, he came up out of the water at once, and suddenly the heavens opened to him; he saw the Spirit of our Father coming down like a dove and settling on him. Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi.
17 Then a voice from heaven said, "This is my Son, the one I love; I delight in him." Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]