Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then the Holy Spirit led Jesus into the wilderness to be tempted by the devil. Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.
2 And after fasting forty days and forty nights, he was hungry. Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
3 The tempter came and said, "If you're the Son of God, tell these stones to become bread." Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”
4 But he answered, "It is written, 'People do not live by bread alone, but by every word from our Father's mouth.'" Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”
5 Then the devil took him into the holy city, stood him on the temple's highest point, Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu,
6 and told him, "If you're God's Son, throw yourself down, since Scripture says, 'He will command his angels about you, and they will carry you on their hands, so you won't strike your foot on a stone.'" sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
7 Jesus said to him, "Again it is written, 'You must not put your Father to the test.'" Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’”
8 Again the devil took him to a very high mountain and showed him all the world's kingdoms and their glory. Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.
9 He said to him, "All these I will give you, if you bow down and worship me." Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
10 Then Jesus told him, "Get away, Satan! For Scripture says, 'Worship your Father, and serve only him.'" Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
11 Then the devil left him, and suddenly angels came and took care of him. Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
12 Now when he heard that John had been arrested, he withdrew into Galilee. Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili.
13 He left Nazareth and settled in Capernaum, by the sea, in the territory of Zebulun and Naphtali, Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị.
14 so that what was spoken by the prophet Isaiah might be fulfilled: Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị,
15 "The land of Zebulun and the land of Naphtali, the way of the sea, beyond the Jordan, Galilee of the Gentiles, “Ala Zebụlọn na ala Naftalị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ,
16 the people dwelling in darkness have seen a great light, and for those dwelling in the region and shadow of death, on them a light has dawned." ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.”
17 From that time Jesus began to preach, saying, "Repent, for the kingdom of our Father is near." Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
18 Walking by the Sea of Galilee, he saw two brothers, Simon called Peter and his brother Andrew, casting a net into the sea—they were fishermen. Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.
19 And he said to them, "Follow me, and I will make you fishers of people." Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
20 Immediately they left their nets and followed him. Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
21 Going on from there, he saw two more brothers—James son of Zebedee and John his brother—in the boat with their father Zebedee, mending nets, and called them. Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha,
22 Immediately they left the boat and their father and followed him. ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
23 He went all through Galilee, teaching in their synagogues, announcing the good news of the kingdom, and healing every disease and sickness among the people. Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.
24 News of him spread through all Syria. They brought him all who were sick—gripped by various diseases and pains, oppressed by demons, epileptic, paralyzed—and he healed them. Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile.
25 Large crowds followed him from Galilee, the Decapolis, Jerusalem, Judea, and beyond the Jordan. Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]