Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After Jesus was born in Bethlehem, Judea, in the days of King Herod, magi from the east arrived in Jerusalem, Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem,
2 saying, "Where is the one born king of the Jews? For we saw his star in the east and have come to worship him." na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”
3 When Herod the king heard this, he was troubled, and all Jerusalem with him. Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem.
4 He gathered all the people's chief priests and scribes, asking where the Christ was to be born. Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.
5 They told him, "In Bethlehem of Judea, for this is what was written through the prophet: Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,
6 'Yet you, Bethlehem, in Judah's land, are certainly not the least among Judah's rulers; for from you a ruler will emerge who will shepherd Israel, my people.'" “ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’”
7 Then Herod secretly summoned the magi and learned from them the exact time the star had appeared. Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè.
8 He sent them to Bethlehem, saying, "Go, search carefully for the child. When you find him, come back and tell me, so that I too may go and worship him." O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”
9 After hearing the king, they set out; the star they had seen in the east went ahead of them until it stopped over where the child was. Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ.
10 When they saw the star, they rejoiced with overwhelming joy. Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ.
11 Entering the house, they saw the child with Mary his mother, fell down and worshiped him. They opened their treasure boxes and gave him gifts: gold, frankincense, and myrrh. Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá.
12 Warned in a dream not to return to Herod, they went back to their own country by a different route. Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.
13 After they left, an angel of our Father appeared to Joseph in a dream: "Get up, take the child and his mother, flee to Egypt, and stay until I tell you—Herod is about to search for the child to kill him." Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.”
14 And he got up and took the child and his mother by night and left for Egypt, Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt.
15 and stayed there until Herod died, fulfilling what our Father said through the prophet: "Out of Egypt I called my son." Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.”
16 Then Herod, seeing the magi had outwitted him, grew furious and sent men to kill all boys two years old and under in Bethlehem and its whole region, matching the time he'd learned from the magi. Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.
17 This fulfilled what was spoken through Jeremiah the prophet: E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
18 "A voice was heard in Ramah, weeping and loud mourning, Rachel weeping for her children; she refused to be comforted, because they are no more." “A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”
19 But when Herod died, an angel of our Father appeared in a dream to Joseph in Egypt, Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt
20 saying, "Get up, take the child and his mother, go to Israel's land, for those seeking the child's life are dead." sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”
21 So he got up, took the child and his mother, and went to Israel's land. Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel.
22 Hearing that Archelaus was ruling Judea in place of his father Herod, he was afraid to go there. Warned in a dream, he withdrew to the region of Galilee. Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili.
23 He went and lived in a town called Nazareth, fulfilling the prophets' words: "He will be called a Nazarene." Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]