Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 24 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jesus was leaving the temple when his disciples came to show him its buildings. Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
2 "Do you see all these?" he answered. "Truly I tell you: not one stone here will be left on another; all will be torn down." Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”
3 While Jesus was sitting on the Mount of Olives, his disciples came to him privately: "Tell us, when will these things happen, and what sign marks your coming and the end of the age?" Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?”
4 Jesus answered, "Watch out that no one deceives you. Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ.
5 "For many will come in my name, claiming, 'I am the Christ,' and they will deceive many. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
6 You'll hear of wars and rumors of wars—don't be alarmed. This must happen, but the end isn't yet. Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola.
7 Nation will rise against nation, and kingdom against kingdom, with famines and earthquakes in place after place. Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche.
8 All these are the beginning of birth pains. Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.
9 Then they will hand you over to suffering and kill you, hated by all nations because of my name. “Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
10 At that time many will fall away and will betray and hate one another, Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị.
11 and many false prophets will appear and deceive many people. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ.
12 Because lawlessness will increase, the love of most will grow cold, Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi.
13 but the one who endures to the end will be saved. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
14 This good news of the kingdom will be announced worldwide as a testimony to all nations, and then the end will come. A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa.
15 So when you see the desolating abomination Daniel the prophet spoke of standing in the holy place—let the reader understand, “Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara).
16 then let those who are in Judea flee to the mountains. Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu.
17 "Let no one on the rooftop go down to take anything out of the house, Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya.
18 and let no one in the field go back to get a coat. Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya.
19 How dreadful it will be in those days for pregnant women and nursing mothers! Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ
20 Pray that your flight will not take place in winter or on the Sabbath. Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike.
21 For then there will be great suffering, unmatched from the world's beginning until now, and never to be matched again. Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ.
22 If those days had not been cut short, no one would survive; but for the elect's sake, those days will be cut short. “Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ.
23 Then if anyone tells you, 'Look, here's the Christ,' or 'There he is,' don't believe it. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
24 False messiahs and false prophets will arise, performing great signs and wonders to deceive, if possible, even the elect. Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara.
25 See, I have told you ahead of time. Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị.
26 So if they say, 'Look, he's in the wilderness,' don't go out; 'Look, in the inner rooms,' don't believe it. “Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela.
27 For just as lightning flashes from the east and shows as far as the west, so will the Son of Man's coming be. Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ.
28 Wherever there is a carcass, there the vultures will gather. Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.
29 Right after the suffering of those days, the sun will go dark, the moon will give no light, stars will fall from the sky, and the powers of the heavens will shake. “Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’
30 Then the sign of the Son of Man will appear in heaven, and all earth's peoples will mourn, seeing the Son of Man come on heaven's clouds with power and great glory. “Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube.
31 He will send out his angels with a loud trumpet blast, and they will gather his chosen from the four winds, from one end of the sky to the other. Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.
32 Learn this from the fig tree: as soon as its branch softens and leafs out, you know summer is near. “Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
33 So also, when you see all these things, know it is near, at the door. Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu.
34 Truly I tell you, this generation will certainly not pass away until all these things have happened. Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga.
35 Heaven and earth will pass away, but my words will never pass away. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
36 "No one knows that day or hour—not the angels in heaven, not the Son—only the Father. “Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya.
37 As in Noah's days, so will be the Son of Man's coming. Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa.
38 For in the days before the flood, people ate and drank, married and gave in marriage, until the day Noah entered the ark; Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya.
39 and they knew nothing until the flood came and swept them all away. That is how the coming of the Son of Man will be. Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
40 Two men will be in the field; one will be taken and the other left. Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.
41 Two women will be grinding with a hand mill; one will be taken and the other left. Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ.
42 Therefore keep watch, because you do not know on what day your Lord will come. “Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
43 Understand: had the homeowner known what watch of night the thief was coming, he'd have watched and kept his house from being broken into. Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya.
44 So you too must be ready, because the Son of Man comes at an hour you don't expect. Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.
45 Who then is the faithful and wise servant, whom the master put in charge of his household to give them food at the right time? “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya?
46 It will be good for that servant whose master finds him doing so when he returns. Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a.
47 Truly I tell you, he will put him in charge of all his possessions. Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.
48 But suppose that wicked servant says to himself, 'My master is staying away a long time,' Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’
49 and then begins to beat his fellow servants and to eat and drink with drunkards. ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ.
50 That servant's master will come on a day he doesn't expect, at an hour he doesn't know. Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị.
51 He will cut him to pieces and place him with the hypocrites, where people weep and grind their teeth." Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]