Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 25 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "Then the kingdom of our Father will be like ten virgins who took their lamps and went out to meet the bridegroom. “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ.
2 Five of them were foolish, and five were wise. Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.
3 The foolish ones took their lamps but did not take any oil with them. Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ.
4 But the wise ones took oil in flasks along with their lamps. Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha.
5 When the bridegroom was delayed, they all became drowsy and fell asleep. Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.
6 But at midnight a cry rang out: 'Look, the bridegroom! Come out to meet him!' “Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’
7 Then all the young women woke up and trimmed their lamps. “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha.
8 The foolish said to the wise, 'Give us some of your oil, because our lamps are going out.' Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’
9 But the wise answered, 'No, there may not be enough for us and you. Go instead to those who sell, and buy for yourselves.' “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’
10 While they went to buy it, the bridegroom came. The ready ones went in with him to the wedding feast, and the door closed. “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
11 Later the other young women came too, saying, 'Lord, lord, open the door for us!' “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’
12 But he answered, 'Truly I tell you, I do not know you.' “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
13 Therefore keep watch, because you do not know the day or the hour. “Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.
14 "For it will be like a man going abroad, calling his servants and entrusting them with his property. “Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka.
15 He gave one five bags of silver, another two, another one—each by his own ability—then set out on his journey. O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya.
16 The one given five bags of silver went at once, put them to work, and gained five more. Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru.
17 In the same way, the one with two bags of silver gained two more. Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru.
18 But the one who received one bag of silver went off, dug in the ground, and hid his master's money. Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.
19 "After a long time the master of those servants returned and settled accounts with them. “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya.
20 The man who received five bags of silver came, adding five more: 'Master, you entrusted me with five bags of silver; see, I've gained five more.' Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’
21 "His master said, 'Well done, good and faithful servant! You were faithful over a little; I'll put you over much. Enter your master's joy!' “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
22 "The one with two bags of silver also came and said, 'Master, you gave me two bags of silver; look, I've earned two more.' “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’
23 "His master told him, 'Well done, good and faithful servant! You were faithful with a little; I'll put you over much. Enter your master's joy!' “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
24 "Then the one who had received one bag of silver came and said, 'Master, I knew you were a hard man, reaping where you didn't sow, gathering where you didn't scatter seed.' “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị.
25 Afraid, I went and hid your silver in the ground. Here is what is yours. Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’
26 "His master replied, 'You wicked, lazy servant! You knew I harvest where I didn't sow and gather where I didn't scatter seed? “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.
27 "You should have deposited my money with the bankers, so on my return I'd get it back with interest. Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.
28 So take his bag of silver and give it to the one with ten bags of silver. “ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri.
29 For everyone who has will be given more, and he'll overflow; but the one who has nothing will lose even what he has. Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere.
30 Throw out that worthless servant into the outer darkness, where there will be weeping and grinding of teeth.' Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
31 "When the Son of Man comes in his glory, with all his angels, he will sit on his glorious throne. “Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya.
32 All the nations will be gathered before him, and he will separate them from each other as a shepherd separates sheep from goats. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
33 He will put the sheep on his right and the goats on his left. Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.
34 Then the King will say to those on his right, 'Come, you blessed by my Father; inherit the kingdom prepared for you since the foundation of the world. “Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
35 "For I was hungry and you fed me; thirsty, and you gave me a drink; a stranger, and you took me in, Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m.
36 I was naked and you dressed me, sick and you cared for me, in prison and you visited me.'" Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’
37 "Then the righteous will answer him, 'Lord, when did we see you hungry and feed you, or thirsty and give you drink? “Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?
38 "When did we see you a stranger and shelter you, or naked and dress you? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe?
39 When did we see you sick or in prison and come to you?'" Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’
40 "And the King will reply, 'Truly I tell you, whatever you did for one of the least of these siblings of mine, you did for me.' “Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’
41 Then he'll tell those on his left, 'Away from me, you cursed ones, into the eternal fire prepared for the devil and his angels. “Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.
42 For I was hungry and you gave me nothing to eat, thirsty and you gave me nothing to drink, Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.
43 I was a stranger, and you didn't take me in; naked, and you didn't dress me; sick and in prison, and you didn't visit me.'" Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’
44 "Then they too will answer, 'Lord, when did we see you hungry, thirsty, a stranger, naked, sick, or in prison, and not serve you?' “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’
45 "He will answer, 'Truly I tell you: whatever you didn't do for one of the least of these, you didn't do for me.' “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’
46 Then they will go away to eternal punishment, but the righteous to eternal life." “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]