Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then Jesus spoke to the crowds and to his disciples, Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị,
2 saying, "The scribes and the Pharisees sit on Moses' seat. “Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis.
3 "So do and keep whatever they tell you, but not what they do—they preach, but don't do. Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.
4 They tie up heavy, hard-to-carry loads and put them on people's shoulders, but they themselves won't lift a finger to move them. Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha.
5 They do everything to be seen by others; they widen their phylacteries and lengthen their tassels, “Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu.
6 and they love the place of honor at feasts and the best seats in the synagogues, Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya.
7 and greetings in the marketplaces and being called 'Rabbi' by others. Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’
8 You must not be called 'Rabbi,' since you have only one teacher, and you're all brothers. “Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu.
9 And call no one on earth your father, for you have one Father, who is in heaven. Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe.
10 Don't let anyone call you 'instructor,' for you have one instructor, the Christ. Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst.
11 The greatest among you will be your servant. Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
12 Whoever raises himself will be humbled; whoever humbles himself will be raised. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
13 Woe to you, scribes and Pharisees, hypocrites! For you shut the kingdom of our Father before people, neither entering yourselves nor letting in those trying to enter. “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.
14 Not in this edition “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu.
15 Woe to you, scribes and Pharisees, hypocrites! For you cross sea and land to make one convert, then make him twice the child of hell you are. “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu.
16 Woe to you, blind guides! You say, 'Swearing by the temple means nothing, but swearing by the temple's gold makes the oath binding.' “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.
17 Blind fools! Which is greater: the gold, or the temple that makes the gold sacred? Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ?
18 And you say, 'Swearing by the altar is nothing, but swearing by its gift is binding.' Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’
19 You blind men! For which is greater, the gift or the altar that makes the gift sacred? Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ?
20 So whoever swears by the altar swears by it and by everything on it. Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ.
21 And whoever swears by the temple swears by it and by him who lives in it. Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi.
22 And whoever swears by heaven swears by our Father's throne and by him who sits on it. Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nʼelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.
23 Woe to you, scribes and Pharisees, hypocrites! You bring the tenth of mint, dill, and cumin, yet neglect the law's weightier matters—justice, mercy, faithfulness. These you should have done, without neglecting the others. “E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya.
24 You blind guides, straining out a gnat and swallowing a camel! Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel.
25 Woe to you, scribes and Pharisees, hypocrites! You clean the cup and dish outside, but inside they're full of greed and excess. “Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile.
26 Blind Pharisee! First clean the inside of cup and dish, so the outside is clean too. Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.
27 Woe to you, scribes and Pharisees, hypocrites! You are like whitewashed tombs, appearing beautiful outside but full of dead people's bones and all impurity inside. “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha.
28 So you also outwardly appear righteous to others, but inside you are full of hypocrisy and lawlessness. Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume.
29 Woe to you, scribes and Pharisees, hypocrites! For you build tombs of the prophets and decorate the monuments of the righteous, “E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume.
30 saying, 'Had we lived in our fathers' days, we would not have joined them in killing the prophets.' Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma.
31 So you testify against yourselves that you are the sons of those who murdered the prophets. Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma.
32 Fill up, then, the measure of your fathers. Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere.
33 You serpents, you brood of vipers, how are you to escape being sentenced to hell? “Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ?
34 So I am sending you prophets, wise men, and scribes—some you will kill and crucify, some you will flog in your synagogues and persecute from town to town, Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ.
35 so that all righteous blood shed on earth may come upon you—from righteous Abel's blood to Zechariah son of Berekiah's, whom you murdered between the sanctuary and the altar. Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.
36 Truly, I say to you, all these things will come upon this generation. Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a.
37 Jerusalem, Jerusalem—killing the prophets, stoning those sent to you! How often I wanted to gather your children, as a hen gathers her chicks under her wings, but you refused. “O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a!
38 Look, your house is left to you desolate. Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
39 I tell you, you won't see me again till you say, 'Blessed is the one coming in our Father's name.'" Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]