Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jesus spoke to them again in parables, saying: Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị,
2 "The kingdom of our Father is like a king who prepared a wedding feast for his son. “Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke.
3 He sent his servants to summon the invited guests to the wedding feast, but they refused to come. O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa.
4 Again he sent other servants, saying, 'Tell those invited: Look, I have prepared my dinner; my oxen and fattened cattle are killed, everything ready. Come to the wedding feast.' “O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’
5 But they paid no attention and went off, one to his farm, another to his business, “Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya.
6 while the rest seized his servants, mistreated them, and killed them. Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha.
7 The king was enraged, and he sent his troops, destroyed those murderers, and burned their city. Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ.
8 Then he told his servants, 'The wedding is ready, but those invited weren't worthy. “Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi.
9 Go therefore to the main roads and invite to the wedding feast as many as you find.' Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’
10 Those servants went out into the roads and gathered everyone they found, bad and good, and the wedding hall filled with guests. Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.
11 "But when the king came in to see the guests, he saw a man not dressed in wedding clothes. “Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye.
12 He asked, 'Friend, how did you get in here without wedding clothes?' He was speechless. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa.
13 Then the king told the servants, 'Tie his hands and feet, and throw him into the outer darkness, where there will be weeping and grinding of teeth.' “Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
14 For many are called, but few are chosen." “Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
15 Then the Pharisees went and plotted how to trap him with his own words. Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya.
16 They sent their disciples to him, with the Herodians, saying, "Teacher, we know you are truthful and truly teach God's way; you defer to no one, since you don't judge people by rank. Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ.
17 Tell us, then, what you think: Is it lawful to pay taxes to Caesar, or not?" Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
18 But Jesus, knowing their malice, said, "Why are you testing me, you hypocrites? Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?
19 Show me the coin used for the tax." And they brought him a denarius. Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego.
20 And he said to them, "Whose image is this, and whose inscription?" Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?”
21 They said, "Caesar's." Then he said to them, "So pay Caesar what belongs to Caesar, and our Father what belongs to our Father." Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”
22 When they heard it, they were amazed; and they left him and went away. Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.
23 That same day Sadducees came to him, who say there is no resurrection, and they asked him, Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ.
24 saying, "Teacher, Moses said: if a man dies childless, his brother must marry the widow and raise offspring for his brother. Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa.
25 Now there were seven brothers among us. The first married, died, and, childless, left his wife to his brother. Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya.
26 So too the second and the third, down to the seventh. Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa.
27 Last of all, the woman died. Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara.
28 In the resurrection, then, whose wife of the seven will she be? For they all had her." Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?”
29 Jesus answered, "You're mistaken—you know neither the Scriptures nor our Father's power. Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere.
30 For in the resurrection people neither marry nor are married off, but are like angels in heaven. Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
31 Now, about the resurrection of the dead, haven't you read what our Father told you: Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị,
32 'I'm the God of Abraham, of Isaac, and of Jacob'? He's not God of the dead, but of the living." Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”
33 And when the crowds heard it, they were astonished at his teaching. Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.
34 But when the Pharisees heard that he had silenced the Sadducees, they gathered together. Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe.
35 And one of them, an expert in the Law, asked him a question to test him: Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya:
36 "Teacher, which is the great commandment in the Law?" “Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?”
37 He said to him, "Love your Father with all your heart, with all your soul, and with all your mind. Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’
38 This is the great and first commandment. Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.
39 And a second is like it: You will love your neighbor as yourself. Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’
40 On these two commandments depend all the Law and the Prophets." Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
41 Now while the Pharisees were gathered together, Jesus asked them, Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha,
42 "What do you think about the Christ? Whose son is he?" They said to him, "David's." “Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.”
43 He asked them, "How then does David, by the Holy Spirit, call him Lord, saying, Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị,
44 'Our Father said to my Lord, "Sit at my right hand, until I put your enemies under your feet"'? “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
45 If then David calls the Christ Lord, how can the Christ be David's son?" Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?”
46 No one could answer him a word, and from that day no one dared ask him anything else. Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]