Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 As they neared Jerusalem and reached Bethphage, at the Mount of Olives, Jesus sent two disciples ahead, Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
2 telling them, "Go to the village ahead of you. You'll at once find a donkey tied, with a colt beside her. Untie them and bring them to me. Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha.
3 If anyone says anything to you, say, 'The Lord needs them,' and the Lord will send them at once." Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.”
4 This took place to fulfill what the prophet had said: E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.
5 "Say to the daughter of Zion, 'Look, your king is coming to you, humble and mounted on a donkey, on a colt, the foal of a beast of burden.'" “Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ”
6 The disciples went and did as Jesus had directed them. Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee.
7 They brought the donkey and colt, put their cloaks on the animals, and Jesus sat on the cloaks. Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha.
8 Most of the crowd spread their cloaks on the road; others cut branches from the trees and spread them on the road. Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya.
9 The crowds ahead of him and behind him kept shouting, "Hosanna to the Son of David! Blessed is he who comes in the name of our Father! Hosanna in the highest!" Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
10 And when he entered Jerusalem, the whole city was stirred, asking, "Who is this?" Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?”
11 And the crowds said, "This is the prophet Jesus, from Nazareth of Galilee." Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.”
12 Then Jesus entered the temple, drove out all selling and buying there, overturned the money-changers' tables and the dove sellers' seats. Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.
13 He told them, "It is written: 'My house will be called a house of prayer,' but you're making it a den of robbers." Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’”
14 And the blind and the lame came to him in the temple, and he healed them. Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.
15 When the chief priests and teachers of the law saw the wonders he did, and the children shouting in the temple, "Hosanna to the Son of David!" they grew angry, Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.
16 and said to him, "Do you hear what these say?" Jesus said to them, "Yes. Have you never read, 'Out of the mouths of infants and nursing babies you have prepared praise'?" Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ ?”
17 He left them, went out of the city to Bethany, and spent the night there. Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.
18 Early in the morning, as he returned to the city, he was hungry. Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
19 Seeing a fig tree by the road, he went to it but found only leaves. He said, "May you never bear fruit again!" At once the tree withered. Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.
20 Seeing this, the disciples were amazed and asked, "How did the fig tree wither so fast?" Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”
21 Jesus answered, "I tell you the truth: with faith, no doubting, you'll not only do what happened to the fig tree—you'll even tell this mountain, 'Be lifted up and thrown into the sea,' and it will happen. Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa.
22 And whatever you ask in prayer, if you believe, you will receive it." Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”
23 Entering the temple, he was teaching when the chief priests and elders of the people came and asked, "What authority do you have for these things, and who gave you this authority?" Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?”
24 Jesus replied, "I'll ask you one thing too. Tell me the answer, and I'll say by what authority I do these things. Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile.
25 John's baptism—where was it from? From heaven, or from man?" They discussed among themselves, "If we say, 'From heaven,' he will say to us, 'Then why did you not believe him?' Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
26 But if we say, 'From man,' we fear the crowd—they all view John as a prophet." Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.”
27 They answered Jesus, "We don't know." He said, "Neither will I tell you by what authority I do these things." Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.
28 "But what do you think? A man had two sons. Coming to the first, he said, 'Son, go work today in the vineyard.' “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’
29 And he answered, 'I will not,' but later he changed his mind and went. “Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ.
30 He went to the second and said the same. This one answered, 'I'll go, sir'—but didn't go. “Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị.
31 Which of the two did his father's will?" They said, "The first." Jesus told them, "Truly I tell you, tax collectors and prostitutes enter the kingdom of our Father ahead of you." “Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke.
32 "For John came to you in the way of righteousness, and you didn't believe him, but tax collectors and prostitutes did. Even after seeing that, you didn't change your minds and believe him." Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya.
33 "Hear another parable: A landowner planted a vineyard, put a fence around it, dug a winepress in it, built a watchtower, leased it to tenants, and went away on a trip. “Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ.
34 When the harvest time drew near, he sent his servants to the tenants to collect his fruit. Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ.
35 But the tenants seized his servants—they beat one, killed another, and stoned another. “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume.
36 Again he sent other servants, more than the first, and they treated them the same way. Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ.
37 Finally he sent his son to them, saying, 'They will respect my son.' Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’
38 But the tenants, seeing the son, said to each other, 'This is the heir; come, let's kill him and seize his inheritance.' “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’
39 So they seized him, threw him out of the vineyard, and killed him. Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ.
40 Now when the owner of the vineyard comes, what will he do to those tenants?" “Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”
41 They answered, "He will destroy those evil men horribly, and lease the vineyard to other farmers who will give him the fruit in season." Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.”
42 Jesus said to them, "Have you never read in the Scriptures: 'The stone the builders rejected became the cornerstone; this came from our Father, and it's marvelous in our eyes'?" Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’
43 "So I tell you: the kingdom of our Father will be taken from you and given to a nation that produces its fruits. “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ.
44 Whoever falls on this stone will be shattered; whoever it falls on will be crushed." Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.”
45 When the chief priests and the Pharisees heard his parables, they realized he was speaking about them. Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha.
46 They wanted to arrest him but feared the crowds, who considered him a prophet. Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]