Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 20 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "For the kingdom of our Father is like a landowner who went out at dawn to hire workers for his vineyard. “Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya.
2 He agreed to pay the workers a full day's wage and sent them into his vineyard. Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya.
3 About nine o'clock in the morning he went out and saw others standing idle in the marketplace. “Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ.
4 He told them, 'You too, go into the vineyard; I'll pay you whatever's right.' So they went. Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’
5 Going out again about noon and about three in the afternoon, he did the same. Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ.
6 About five in the afternoon, he went out and found others standing there. He asked, 'Why have you stood here idle all day?'" Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’
7 "They said, 'Because no one hired us.' He said, 'You also go into the vineyard.' “Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’
8 "When evening came, the vineyard owner told his foreman, 'Call the workers and pay them their wages, from the last to the first.' “Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’
9 And when those hired about five o'clock came, each of them received a full day's wage. “Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị.
10 When the first came, they thought they would get more, but each got a full day's wage too. Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị.
11 And on receiving it they grumbled at the landowner, Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ,
12 saying, 'These last worked only one hour, yet you made them equal to us, who bore the day's burden and the scorching heat.' na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’
13 "He answered one of them, 'Friend, I'm not wronging you. Didn't you agree with me for a full day's wage?' “Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị?
14 Take what's yours and go. I want to give this last worker the same as you. Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị.
15 Can't I do what I want with what's mine? Or are you jealous because I'm generous? Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’
16 So the last will be first, and the first last." “Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”
17 As Jesus was going up to Jerusalem, he took the twelve aside and said to them on the way, Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha,
18 "See, we are going up to Jerusalem, and the Son of Man will be given over to the chief priests and scribes, who will condemn him to death, “Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ,
19 and hand him over to the Gentiles to mock and flog and crucify—and on the third day he will be raised." nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.”
20 Then Zebedee's sons' mother came to him with her sons, kneeling to ask something of him. Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha.
21 He asked her, "What do you want?" She said, "Say my two sons will sit one at your right, one at your left, in your kingdom." Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.”
22 But Jesus replied, "You don't know what you're asking. Can you drink the cup I am about to drink?" "We can," they said. Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?” Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”
23 He said, "You will drink my cup, but seating at my right and left is not mine to give—it belongs to those my Father has prepared it for." Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.”
24 When the ten heard this, they were angry at the two brothers. Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a.
25 Jesus called them over and said, "You know the rulers of the Gentiles lord it over them, and their powerful men hold authority over them. Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha.
26 Not so among you. Rather, whoever wants to be great among you must be your servant, Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi.
27 and whoever wants to be first among you must be your slave, Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile.
28 just as the Son of Man came not to be served but to serve, and to give his life as a ransom for many." Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
29 And as they went out of Jericho, a great crowd followed him. Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ.
30 Two blind men sitting by the road heard Jesus was passing and cried out, "Lord, have mercy on us, Son of David!" Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”
31 The crowd scolded them to be quiet, but they shouted louder, "Have mercy on us, Lord, Son of David!" Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”
32 And stopping, Jesus called them and said, "What do you want me to do for you?" Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
33 They said to him, "Lord, let our eyes be opened." Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.”
34 And Jesus, moved with compassion, touched their eyes, and immediately they recovered their sight and followed him. Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]