Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When Jesus finished these words, he left Galilee and went into the region of Judea, across the Jordan. Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan.
2 Large crowds followed him, and he healed them there. Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ.
3 Pharisees came to test him, asking, "Is it lawful for a man to divorce his wife for any cause?" Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?”
4 He answered, "Haven't you read that our Father, who made them at the beginning, made them male and female, Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
5 and said, 'So a man will leave his father and mother and cling to his wife, and the two will become one flesh'? Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.
6 So they are no longer two but one flesh; therefore, let no one separate what our Father has joined." Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
7 They said to him, "Why then did Moses command that a man give a divorce certificate and send her away?" Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?”
8 He told them, "Moses let you divorce your wives because your hearts were hard, but it wasn't like that from the beginning. Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.
9 I tell you: whoever divorces his wife—except for sexual sin—and marries another commits adultery." Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”
10 The disciples said to him, "If that's the case between husband and wife, it's better not to marry." Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.”
11 He said to them, "Not everyone can accept this word—only those it's given to. Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.
12 There are eunuchs born that way from their mother's womb; there are eunuchs made that way by others; and there are eunuchs who made themselves so for the kingdom of our Father. Let the one who can accept this, accept it." Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”
13 Then little children were brought to him so he could lay hands on them and pray, but the disciples rebuked those bringing them. Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.
14 But Jesus said, "Let the little children come to me—don't stop them, for the kingdom of our Father belongs to ones like these." Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”
15 And he laid his hands on them and went on from there. O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.
16 Just then a man approached him and asked, "Teacher, what good must I do to obtain eternal life?" Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”
17 He said to him, "Why ask me about what is good? Only one is good. If you want to enter life, keep the commandments." Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.”
18 "Which ones?" he asked. Jesus said, "Do not murder, do not commit adultery, do not steal, do not testify falsely, Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.
19 honor your father and mother, and love your neighbor as yourself." Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
20 The young man said to him, "All these I have kept. What do I still lack?" Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”
21 Jesus told him, "If you want to be complete, go, sell your possessions and give to the poor—you'll have treasure in heaven—then come, follow me." Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.”
22 When the young man heard this, he went away grieving, because he had great wealth. Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
23 Jesus said to his disciples, "Truly, I tell you: a rich person will hardly enter our Father's kingdom. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe.
24 I tell you again: a camel fits through the eye of a needle easier than a rich person enters our Father's kingdom." Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
25 When the disciples heard this, they were greatly astonished and asked, "Who then can be saved?" Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
26 Jesus looked at them and said, "This is impossible for people, but everything is possible with our Father." Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”
27 Then Peter said to him, "Look, we've left everything and followed you. What then will we have?" Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?”
28 Jesus told them, "Truly: in the renewal, when the Son of Man sits on his glorious throne, you who followed me will also sit on twelve thrones, judging the twelve tribes of Israel. Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
29 "Everyone who has left houses or brothers or sisters or father or mother or children or fields for my name will receive one hundred times more and inherit eternal life. Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.
30 But many who are first will be last, and many who are last will be first." Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]