Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 At that time the disciples came to Jesus, asking, "Who, then, is greatest in the kingdom of our Father?" Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?”
2 Calling a little child to him, he placed the child among them, Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha,
3 and said, "I tell you truly: unless you turn and become like little children, you'll never enter our Father's kingdom. ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe.
4 Whoever therefore humbles himself like this little child is the greatest in the kingdom of our Father. Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
5 And whoever welcomes one such little child in my name welcomes me." Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m.
6 "But whoever trips up one of these little ones who believe in me—better to hang a heavy millstone on his neck and drown him in the depths of the sea." “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya.
7 "Disaster for the world because of things that cause stumbling! They must come, but disaster for whoever brings them. Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa.
8 If your hand or foot makes you stumble, cut it off, throw it away. Better to enter life crippled or lame than keep both hands or both feet and be thrown into the eternal fire." Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi.
9 If your eye trips you up, tear it out and throw it away. Better to enter life with one eye than to keep both and be thrown into hell's fire. Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.
10 "See that you don't look down on one of these little ones. I tell you, their angels in heaven always see my Father's face in heaven." “Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.
11 Not in this edition Nʼihi na Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu.
12 "What do you think? If a man has one hundred sheep and one wanders off, won't he leave the ninety-nine on the hills and go look for the one that wandered? “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?
13 If he finds it, I assure you: he rejoices over it more than over the ninety-nine that never strayed. Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ọ ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ.
14 So it is not your Father in heaven's will that one of these little ones perish.' Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi.
15 "If your brother sins against you, go, show him his fault—you and he alone. If he listens, you've won your brother over. “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru.
16 But if he won't listen, bring one or two more with you, so every matter stands by the mouth of two or three witnesses. Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’
17 If he won't listen to them, tell the church. If he won't listen to the church either, treat him like an outsider or a tax collector. Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ.
18 Truly I tell you, whatever you bind on earth will be bound in heaven, and whatever you loose on earth, loosed in heaven. “Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe.
19 Again, truly I tell you: if two of you on earth agree about anything they ask, my Father in heaven will do it for them. “Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.
20 For where two or three are gathered together in my name, there I am among them." Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”
21 Then Peter came to Jesus: "Lord, how many times must I forgive my brother who sins against me? Up to seven times?" Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?”
22 Jesus answered, "I tell you, not seven times, but seventy-seven times. Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa.
23 So the kingdom of our Father is like a king who wanted to settle accounts with his servants. “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji.
24 When he began settling accounts, a man owing a fortune was brought to him. Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri.
25 Since he could not pay, his master ordered him and his wife, children, and all he had sold, and the debt repaid." Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji.
26 So the servant knelt before him, pleading, "Be patient with me, and I will repay everything. “Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’
27 The master of that servant, his heart moved with compassion, released him and forgave him the debt." Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.
28 "That servant then went out, found a fellow servant who owed him one hundred days' wages, grabbed him, and began choking him: 'Pay back what you owe me!'" “Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’
29 So his fellow servant knelt and pleaded with him, "Be patient with me; I'll repay you. “Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’
30 But he refused, went and threw him into prison until he paid the debt. “Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya.
31 Seeing what had happened, his fellow servants were deeply grieved, went, and told their master all that had happened." Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a.
32 Then the master summoned him. "Wicked servant," he said, "I forgave you all that debt because you begged me. “Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ.
33 Shouldn't you also have shown your fellow servant mercy, as I showed you mercy? Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’
34 Furious, his master handed him to the torturers until he repaid the whole debt. Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji.
35 My heavenly Father will do the same to you, unless each forgives his brother from the heart." “Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]