Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Six days later, Jesus took Peter, James, and John his brother, and led them up a high mountain alone. Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ.
2 He was transfigured before them: his face shone like the sun, his clothes turned white as light. Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè.
3 Suddenly, Moses and Elijah appeared to them, talking with him. Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu.
4 Peter said to Jesus, "Lord, it's good we're here. If you want, I'll build three shelters—one for you, one for Moses, and one for Elijah." Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.”
5 While he was still speaking, a bright cloud covered them, and a voice from the cloud said, "This is my beloved Son; I delight in him. Listen to him." Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.”
6 When the disciples heard it, they fell on their faces and were terrified. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu.
7 But Jesus came and touched them, "Rise, and do not be afraid." Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.”
8 When they looked up, they saw only Jesus. Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jisọs.
9 Descending the mountain, Jesus ordered them, "Tell no one the vision until the Son of Man is raised from the dead." Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.”
10 The disciples asked him, "Then why do the scribes say that Elijah must come first?" Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
11 He answered, "Elijah does come, and he will restore all things. Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ.
12 But I tell you, Elijah has already come, and they didn't recognize him, but treated him as they pleased. So too the Son of Man is about to suffer at their hands." Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.”
13 Then the disciples understood that he was speaking to them about John the Baptist. Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya.
14 And when they came to the crowd, a man came up to him, kneeling before him, Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya,
15 and saying, "Lord, have mercy on my son, for he has seizures and suffers terribly, often falling into fire, often into water. rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri.
16 And I brought him to your disciples, and they could not heal him." Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.”
17 Jesus answered, "Unfaithful, twisted generation! How long must I remain with you, how long put up with you? Bring him here to me." Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.”
18 And Jesus rebuked the demon, and it came out of him, and the boy was healed instantly. Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.
19 Then the disciples came to Jesus privately and said, "Why could we not cast it out?" Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”
20 He said to them, "Because your faith is small. Truly I tell you: with faith like a mustard seed, you will tell this mountain, 'Move from here to there,' and it will move. Nothing will be impossible for you." Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.
21 Not in this edition Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.”
22 While gathering in Galilee, Jesus told them, "The Son of Man is about to be handed over to men, Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ.
23 they will kill him, and on the third day he will be raised." They were deeply grieved. Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.
24 Arriving in Capernaum, the temple tax collectors approached Peter and asked, "Doesn't your teacher pay the temple tax?" Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”
25 He said, "Yes." When he entered the house, Jesus spoke first: "What do you think, Simon? From whom do earthly kings collect tolls or taxes—from their own sons, or from others?" Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?”
26 And when Peter said, "From others," Jesus said to him, "Then the sons are free." Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ.
27 "But so we don't offend them, go to the sea, cast a hook, and take the first fish that comes up. Open its mouth and you'll find a coin. Take it and give it to them for me and you." Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]