Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The Pharisees and Sadducees came to test him, asking him to show them a sign from heaven. Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.”
2 He replied, "When evening comes, you say, 'The weather will be fair, for the sky is red.' Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’
3 "And in the morning, 'Stormy today, for the sky is red and gloomy.' You know how to read the sky's face, but can't read the times' signs. Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.
4 "An evil, unfaithful generation seeks a sign; no sign will be given except the sign of Jonah." Then he left them and went away. Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ.
5 When the disciples crossed to the other side, they had forgotten to bring bread. Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla.
6 Jesus said to them, "Watch out and beware of the yeast of the Pharisees and Sadducees." Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”
7 They discussed this among themselves and said, "It is because we brought no bread." Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla.
8 Aware of this, Jesus said, "Why discuss among yourselves, you of little faith, that you have no bread? Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha?
9 Still, don't you understand? Don't you remember the five loaves for the 5,000, and how many baskets you collected? Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru?
10 "Or the seven loaves for the 4,000, and how many baskets you gathered? Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?
11 "Why don't you understand I wasn't talking to you about bread? Watch out for the yeast of the Pharisees and Sadducees." Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”
12 Then they understood that he had not told them to beware of the yeast in bread, but of the Pharisees' and Sadducees' teaching. Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
13 Arriving in the area of Caesarea Philippi, Jesus asked his disciples, "Who do people say the Son of Man is?" Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?”
14 They said, "Some say John the Baptist, others Elijah, still others Jeremiah or one of the prophets." Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
15 He said to them, "But who do you say that I am?" Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
16 Simon Peter replied, "You are the Christ, the Son of the living Father." Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
17 Jesus replied, "Simon son of Jonah, you are blessed—flesh and blood didn't reveal this to you, but my Father in heaven. Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.
18 "And I tell you: you are Peter, and on this rock I will build my church; the gates of the grave will not overpower it. Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.
19 "I will give you the keys of our Father's kingdom; whatever you bind on earth will have been bound in heaven, and whatever you release on earth will have been released in heaven." Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”
20 Then he strictly ordered the disciples to tell no one that he was the Christ. Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ.
21 From then on, Jesus began telling his disciples he must go to Jerusalem, suffer much from the elders, chief priests, and scribes, be killed, and be raised on the third day. Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.
22 Peter took him aside and rebuked him: "Never, Lord! This will never happen to you." Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”
23 But he turned and told Peter, "Get behind me, Satan! You are an obstacle to me, because you're not thinking about what our Father cares about, but what people care about." Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.”
24 Then Jesus told his disciples, "Whoever wants to come after me must deny himself, take up his cross, and follow me. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.
25 "For whoever wants to save his life will lose it, but whoever loses his life for my sake will find it. Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya.
26 "What good is it if a person gains the whole world but loses his soul? Or what can a person give in exchange for his soul? Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?
27 "For the Son of Man is about to come in his Father's glory with his angels, and will then repay each person according to what they have done. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
28 "Truly I tell you: some standing here will not taste death until they see the Son of Man coming in his kingdom." “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]