Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 20 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị sịrị Mosis,
2 "Tell the Israelites: Any Israelite, or foreigner living in Israel, who gives any of his children to Molech must surely be put to death—the people of the land are to stone him with stones. “Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya.
3 I myself will set my face against that man and cut him off from among his people, for giving any of his children to Molech, making my sanctuary unclean and desecrating my holy name. Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.
4 If the people of the land turn a blind eye when that man gives any of his offspring to Molech, and do not put him to death, Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek,
5 I will set my face against that man and his family, and cut him off—with all who follow him in prostitution to Molech—from among their people. mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek.
6 "Whoever turns to mediums or spiritists, prostituting themselves after them, I will set my face against that person and cut them off from among their people. “ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
7 "Set yourselves apart, therefore, and be holy, for I am your Father. “ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
8 Keep my statutes and do them. I am your Father who makes you holy. Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
9 "Whoever curses his father or his mother must be put to death; he has cursed his father or his mother—his blood is on him. “ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
10 "If a man commits adultery with another man's wife—his neighbor's wife—both adulterer and adulterous woman must surely be put to death. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.
11 "A man who sleeps with his father's wife has exposed his father's nakedness; both must be put to death; their blood is on them. “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
12 "If a man sleeps with his daughter-in-law, both must be put to death; they have done a perversion; their blood is on them. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere.
13 "If a man lies with a male as with a woman, both have done a detestable thing; they must surely be put to death; their blood is on them. “ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
14 "If a man takes a woman and her mother, that is evil; burn him and them with fire, so no evil remains among you. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.
15 "If a man has sex with an animal, he must be put to death, and you must kill the animal. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.
16 "If a woman approaches any animal to mate with it, kill the woman and the animal; both must be put to death; their blood is on them. “ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
17 "If a man marries his sister, his father's or mother's daughter, and they have sexual relations, it is a disgrace; they must be cut off before their people. He has exposed his sister; he bears his guilt. “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi.
18 "If a man sleeps with a woman during her period, he exposes her flow, and she uncovers its source; both are cut off from their people. “ ‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha.
19 "Do not have sex with your mother's or father's sister—that disrespects a close relative; they will bear their guilt. “ ‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ.
20 A man who sleeps with his uncle's wife disrespects his uncle; they will bear their sin and die childless. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa.
21 "If a man marries his brother's wife, it is impurity; he exposed his brother's nakedness; they will be childless. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.
22 "Keep all my statutes and all my rules, and do them, so the land I'm bringing you to live in won't vomit you out. “ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu.
23 You must not adopt the customs of the nation I am driving out before you, because they did all these things, and I detested them. Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi.
24 I have told you: you will inherit their land; I myself will give it to you to possess, a land flowing with milk and honey. I am your Father, who set you apart from the peoples. Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.
25 "So distinguish clean animals from unclean, and unclean birds from clean. Do not make yourselves detestable by any animal, bird, or thing crawling on the ground that I have set apart for you as unclean. “ ‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ.
26 Be holy to me, for I, your Father, am holy, and I have set you apart from the peoples to be mine. Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ Onyenwe anyị, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m.
27 "A man or woman who is a medium or spiritist must be put to death—stoned; their blood is on them." “ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]