Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Speak to the whole community of Israel: You are to be holy, for I, your Father, am holy. “Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
3 "Each of you must respect your mother and father, and keep my Sabbaths. I am your Father. “ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
4 "Do not turn to idols or make for yourselves gods of cast metal. I am your Father. “ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
5 "When you sacrifice a peace offering to me, offer it so you will be accepted. “ ‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
6 Eat it the day you offer it, or the next; anything left to the third day, burn in fire. Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
7 If any is eaten on the third day, it is foul and will not be accepted. Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
8 Whoever eats it bears their guilt, for they desecrated what is holy to me; that person will be cut off from their people. Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
9 "When you harvest your land, do not reap to the field's edges or gather the gleanings of your harvest. “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.
10 Do not strip your vineyard bare or gather its fallen grapes. Leave them for the poor and the foreigner. I am your Father. A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
11 "Do not steal; do not deceive; do not lie to one another. “ ‘Unu ezula ohi. “ ‘Unu aghala ụgha. “ ‘Unu aghọgbula ibe unu.
12 "Don't swear falsely by my name, desecrating your Father's name. I am your Father. “ ‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
13 "You shall not oppress your neighbor or rob him. Do not hold a hired worker's wages overnight. “ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.
14 "Do not curse the deaf or place a stumbling block before the blind, but fear your Father. I am your Father. “ ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
15 "Do not pervert justice in your decisions. Do not favor the poor or defer to the great, but judge your neighbor fairly. “ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
16 "Don't spread slander among your people, and don't stand idle while your neighbor's life is in danger. I am your Father. “ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
17 "Do not hate your brother in your heart; correct your neighbor openly, so you don't bear sin because of him. “ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
18 Do not take revenge or hold a grudge against your own people, but love your neighbor as yourself. I am your Father. “ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
19 "Keep my decrees. Don't breed your livestock with a different kind. Don't sow your field with two kinds of seed, or wear a garment of two kinds of material. “ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
20 "If a man sleeps with a slave woman assigned to another man, and she has not been bought back or set free, an inquiry is required. They are not to be put to death, since she was not free. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
21 He is to bring his guilt offering to me, at the entrance of the tent of meeting—a ram as the guilt offering. Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
22 The priest will make atonement for him with the ram of the guilt offering before me, for the sin he committed; and he will be forgiven the sin he committed. Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.
23 "When you enter the land and plant any food tree, treat its fruit as forbidden. For three years it is forbidden to you; do not eat it. “ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
24 In the fourth year all its fruit is to be holy, an offering of praise to me. Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
25 But the fifth year you may eat its fruit, so it yields more for you. I am your Father. Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
26 "Do not eat anything with the blood in it. Do not practice fortune-telling or interpret omens. “ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
27 "Do not round off the hair at the sides of your head or damage the edges of your beard. “ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
28 "Don't cut your body for the dead or tattoo yourselves. I am your Father. “ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
29 "Do not desecrate your daughter by making her a prostitute, or the land will turn to prostitution and fill with depravity. “ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
30 "You are to keep my Sabbaths and revere my sanctuary. I am your Father. “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
31 "Do not turn to mediums or necromancers; do not seek to be made unclean by them. I am your Father. “ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
32 "Stand up before the gray-haired and respect the old. Fear your Father. I am your Father. “ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
33 "When a foreigner lives among you in your land, do not mistreat them. “ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
34 The foreigner living among you must be to you as a native, and love them as yourself, for you were foreigners in Egypt. I am your Father. Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
35 "You are to do no wrong in judgment, in measures of length, weight, or quantity. “ ‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
36 Have honest scales, honest weights, an honest grain measure, an honest liquid measure. I am your Father, who brought you out of the land of Egypt. Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
37 "Keep all my statutes and all my rules, and do them. I am your Father." “ ‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]