Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Speak to the children of Israel and say to them: I am your Father. “Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
3 You must not do as Egypt does, where you lived; you must not do as Canaan does, where I am bringing you; you must not follow their statutes. Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.
4 You must follow my judgments and keep my statutes, walking in them. I am your Father. Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
5 Keep my statutes and my judgments; whoever does them will live by them. I am your Father. Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.
6 "None of you may approach any close relative to have sexual relations. I am your Father. “ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
7 "Do not have sex with your mother—that exposes your father's nakedness. She is your mother; do not have sex with her. “ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a.
8 "You must not have sexual relations with your father's wife; that would dishonor your father. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.
9 "Don't have sexual relations with your sister, your father's or mother's daughter, born at home or elsewhere. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama.
10 "Do not have sex with your son's or daughter's daughter—that exposes your own nakedness. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.
11 "Your father's wife's daughter, born to your father, is your sister; do not have sex with her. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ.
12 "You must not have sexual relations with your father's sister; she is your father's close relative. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.
13 "You must not have sexual relations with your mother's sister, for she is your mother's close relative. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ.
14 "Do not dishonor your father's brother by having sex with his wife; she is your aunt. “ ‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ.
15 "Do not have sex with your daughter-in-law; she is your son's wife—do not have sex with her. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya.
16 "You must not have sexual relations with your brother's wife; that would dishonor your brother. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke.
17 "Do not have sex with a woman and her daughter, or take her son's or her daughter's daughter, to have sex with them; they are close relatives—that is depraved. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.
18 "Do not marry a woman as rival to her sister, sleeping with her while the sister is still living. “ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.
19 "Do not approach a woman for sex during her monthly impurity. “ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.
20 "Do not have sex with your neighbor's wife, making yourself unclean by her. “ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.
21 "Do not give any of your children to be passed through the fire to Molech, desecrating your Father's name. I am your Father. “ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
22 "You must not have sexual relations with a male as with a woman; it is detestable. “ ‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ.
23 "Do not have sex with any animal, making yourself unclean; a woman must not present herself to an animal to mate with it. That is a perversion. “ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.
24 "Do not make yourselves unclean by any of these, for by all of them the nations I'm driving out before you became unclean. “ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.
25 The land was made unclean, so I called it to account for its guilt, and it vomited out those living there. Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya.
26 Keep my rules and laws. None of you—native or foreigner among you—may do any of these detestable things. Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
27 For the people of the land before you did all these detestable things, and it was made unclean. Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.
28 Let the land not vomit you out for making it unclean, as it vomited out the nation before you. Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.
29 "Anyone who does any of these detestable things will be cut off from among their people. “ ‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
30 So keep my charge: do none of the detestable customs practiced before you, and do not make yourselves unclean by them. I am your Father." Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]