Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "Speak to Aaron, his sons, and all Israel, and tell them: This is what I have commanded: “Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
3 Any Israelite who slaughters an ox, lamb, or goat inside the camp, or outside the camp, Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi,
4 and doesn't bring it to the tent of meeting's entrance to offer to me before my tabernacle—that man is guilty of bloodshed; he has shed blood and will be cut off from his people. ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.
5 So the Israelites will bring their sacrifices, now offered in the open field, to the priest at the tent of meeting's entrance, offering them as peace offerings to me. Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo.
6 At the tent of meeting's entrance, the priest is to splash the blood on my altar and burn fat, a pleasing aroma to me. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
7 They must no longer sacrifice to the goat demons they prostitute themselves with. This is a lasting law for all their generations. O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’
8 "Tell them: Any Israelite, or foreigner living among them, who offers a burnt offering or sacrifice, “Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,
9 and doesn't bring it to the meeting tent's entrance to offer to me—that man will be cut off from his people. ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya Onyenwe anyị, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya.
10 "Any man of the house of Israel, or foreigner living among them, who eats any blood—I will set my face against that person and cut them off from their people. “ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m.
11 Blood is the flesh's life; I gave it to you on the altar to atone for your souls, for blood atones by the life. Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.
12 So I told Israel: None of you is to eat blood, nor any foreigner living among you. Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”
13 "Any Israelite or foreigner among them who hunts an edible animal or bird must pour out its blood and cover it with dust. “ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.
14 Every creature's life is in its blood. So I told the Israelites: Eat no creature's blood, since its life is its blood—whoever eats it will be cut off. Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.
15 "Anyone, native or foreigner, who eats a carcass or an animal torn by beasts must wash his clothes, bathe in water, stay unclean until evening, then be clean. “ ‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ.
16 But if he does not wash them or bathe his body, he will bear his guilt." Ma ọ bụrụ na ọ saghị uwe ya na ahụ ya, ikpe ọmụma dị ya nʼisi.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]