Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father said to Moses: "Tell the priests, Aaron's sons: No one may make himself unclean for the dead among his people, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa ndị nchụaja, ụmụ ndị ikom Erọn okwu sị ha, ‘Onye nchụaja ekwesighị imerụ onwe ya mgbe mmadụ nwụrụ nʼetiti ụmụnna ya.
2 except for his closest relatives—his mother, his father, his son, his daughter, his brother, Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke,
3 or his virgin sister, close to him, still unmarried—for her he may become unclean. maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya.
4 He must not make himself unclean as a leader among his people and desecrate himself. Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.
5 They must not shave their heads bald, shave off their beard edges, or gash their bodies. “ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.
6 They must be holy to their Father and not desecrate his name; they present our Father's food offerings, his bread, so they must be holy. Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ.
7 They must not marry a prostitute, one made unclean, or one divorced from her husband; the priest is holy to his Father. “ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha.
8 Treat him as holy—he offers your Father's bread. He is to be holy to you, for I, your Father who makes you holy, your Father who sets you apart, am holy. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ.
9 A priest's daughter who desecrates herself by prostitution desecrates her father; she is to be burned with fire. “ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ.
10 The high priest, greatest among his brothers, with anointing oil poured on his head and ordained to wear the garments, must not let his hair hang loose or tear his clothes. “ ‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya.
11 He must not go near a corpse or make himself unclean, even for his father or mother. Ọ gaghị abanye ebe ozu dị. Ọ gaghị emerụ onwe ya, ọ bụladị ma ozu ahụ ọ bụ nke nne ya maọbụ nke nna ya.
12 He must not leave the sanctuary or desecrate his Father's sanctuary; his anointing oil has dedicated him. I am your Father. Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m Onyenwe anyị.
13 He is to marry only a virgin. “ ‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke.
14 He may not marry a widow, divorced woman, or woman made unclean by prostitution—only a virgin from his own people. Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,
15 So he won't desecrate his offspring among his people, for I, your Father, make him holy—his Father who sets him apart." ka ọ ghara ime ka ụmụ ya ghara ịdị nsọ nʼetiti ụmụnna ya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ya nsọ.’ ”
16 And our Father said to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
17 "Speak to Aaron: no descendant of yours, in any generation, who has a defect may approach to offer his Father's food. “Gwa Erọn, ‘Nʼọgbọ niile nke na-abịa, o nweghị onye ọbụla nʼime ụmụ ụmụ gị nke akụkụ ahụ ya na-ezughị oke ga-abịa nso iwetara Chineke ya ihe oriri.
18 No man with a defect may approach: blind, lame, disfigured-faced, or deformed-limbed, O nweghị nwoke ọbụla nwere ọrụsị ọbụla ga-abịa nso, o nweghị nwoke kpuru ìsì, maọbụ onye ngwụrọ, maọbụ onye imi mpịa, maọbụ onye ụkwụ maọbụ aka ya na-ezughị oke,
19 or a man who has a broken foot or a broken hand, maọbụ onye ọkpụkpụ ụkwụ ya maọbụ ọkpụkpụ aka ya gbajiri,
20 or a hunchback, a dwarf, an eye defect, festering sores, scabs, or crushed testicles. maọbụ onye mkpumkpu azụ dị, maọbụ nwa akakpọ, maọbụ onye na-adịghị ahụzi ụzọ, maọbụ onye agba na-ata, maọbụ onye akpụkpa dị nʼahụ, maọbụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.
21 No descendant of Aaron the priest with a defect may approach to offer our Father's food offerings; with a defect, he may not approach to offer his Father's bread. O nweghị nwa nwa Erọn onye nchụaja ọbụla nwere ọrụsị ga-abịa iwetara Onyenwe anyị aja onyinye site nʼọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere ọrụsị, ọ gaghị abịa nso iwetara Chineke ya nri.
22 He may eat the bread of his Father, both the most holy and the holy things. Ma o nwere ike iri nri ahụ dịkarịsịrị nsọ nke sitere na nri Chineke ya, tinyekwara nri ahụ dị nsọ.
23 He must not go near the veil or approach the altar, having a defect, so he won't desecrate my holy places—for I, your Father, make them holy, their Father who sets them apart." Kama ọ gaghị abịa nso akwa mgbochi ahụ maọbụ bịaruo ebe ịchụ aja nso, nʼihi ezughị oke ya. Ka ọ ghara imerụ ebe nsọ m, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”
24 So Moses spoke this to Aaron and his sons and to all the people of Israel. Ya mere Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile iwu ndị a.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]