Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "Tell Aaron and his sons to be careful with the holy offerings Israel's people dedicate to me, so they don't desecrate my holy name. I am your Father. “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
3 "Tell them: In every generation, any descendant of yours who is unclean and approaches the holy offerings Israel's people dedicate to me will be cut off from my presence. I am your Father. “Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.
4 "No descendant of Aaron with a skin disease or discharge may eat the holy offerings until clean. Whoever touches something unclean from a corpse, or a man who has a semen emission, “ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,
5 or touches any swarming creature that makes him unclean, or a person who makes him unclean, whatever his uncleanness. maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.
6 Whoever touches it is unclean until evening and must not eat the holy offerings unless he has washed his body in water. Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.
7 At sunset he is clean; then he may eat the holy offerings, for it is his food. Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.
8 He must not eat anything dead or torn by wild animals, for that makes him unclean. I am your Father. Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.
9 Priests must keep my instructions, or bear guilt and die for treating them with contempt. I am your Father, who makes them holy. “ ‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.
10 "No outsider may eat the holy offering; no guest or hired worker of a priest may eat it. “ ‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya.
11 But if a priest buys a slave with his own money, that slave may eat it; those born in the priest's house may eat his food. Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ.
12 If a priest's daughter marries a non-priest, she may not eat the holy contributions. Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a.
13 But if a priest's daughter is widowed or divorced, has no child, and returns to her father's house as in her youth, she may eat her father's food. No outsider may eat it. Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
14 "Anyone who eats a holy offering by mistake must add a fifth of its value and give it to the priest. “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.
15 Priests must not desecrate the holy offerings Israel's people present to me, Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
16 and bring guilt requiring payment on them by their eating their holy offerings. For I am your Father, who makes them holy." site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”
17 Then our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
18 "Tell Aaron, his sons, and all Israelites: When any of you—native-born or a foreigner living in Israel—brings a burnt offering to me, to fulfill a vow or as a voluntary gift. “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu,
19 Present a male without defect from cattle, sheep, or goats, so it's accepted for you. ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha.
20 Do not present anything with a defect, because it will not be accepted on your behalf. Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị.
21 When anyone brings a peace offering to me from herd or flock to fulfill an extraordinary vow or as a freewill offering, it must be flawless to be accepted—no defect in it. Mgbe onye ọbụla wetara ehi maọbụ atụrụ maọbụ ewu site nʼigwe anụ, dịka onyinye aja udo ọ na-enye Onyenwe anyị maka imezu nkwa, maọbụ onyinye afọ ofufu, ọ ga-abụ nke na-enweghị ọrụsị maọbụ ntụpọ ọbụla tupu a nabata ya.
22 Do not offer me anything blind, broken, maimed, wart-covered, scabbed, or oozing. Do not put any of these on the altar as a food offering to me. Anụmanụ ọbụla kpuru ìsì, maọbụ nke merụrụ ahụ, maọbụ nke ụkwụ maọbụ aka gbajiri, maọbụ nke akpụkpa dị nʼahụ ya, maọbụ ihe nwere ure, maọbụ nke ọnya dị nʼahụ, agaghị abụ ihe onyinye nye Onyenwe anyị. Unu atụkwasịkwala ha nʼebe ịchụ aja dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
23 You may present an ox or sheep that's deformed or stunted as a voluntary offering, but it won't be accepted for a vow. Unu nwere ike jiri ehi maọbụ atụrụ nke akụkụ ahụ ya tara ata, maọbụ nke otu akụkụ ya buru ibu karịa ibe ya chụọ aja onyinye si nʼobi, ma a gaghị e ji ya chụọ aja imezu nkwa.
24 Don't offer me an animal with testicles bruised, crushed, torn, or cut. Don't do this in your own land. Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu.
25 You must not accept such animals from a foreigner to offer as your Father's food, since they are deformed and defective—they will not be accepted for you." Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ”
26 Then our Father said to Moses, Onyenwe anyị sịrị Mosis,
27 "When a calf, lamb, or goat is born, it stays with its mother seven days; from the eighth day on, it is acceptable as a food offering to me. “Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
28 Do not slaughter a cow or a sheep and its young on the same day. Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.
29 "When you sacrifice a thank offering to me, sacrifice it so you'll be accepted. “Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya.
30 It must be eaten that same day; leave none of it until morning. I am your Father. Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị.
31 "Keep my commands and follow them. I am your Father. “Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị.
32 Do not desecrate my holy name; I must be honored as holy among the Israelites. I am your Father, who makes you holy, Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
33 and who brought you out of Egypt to be your Father. I am your Father." Ọ bụ m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt ka m bụrụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]