Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "Speak to the Israelites and tell them: My appointed feasts, which you are to proclaim as holy gatherings—these are my appointed feasts. “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.
3 "Six days work may be done; the seventh is a sabbath of complete rest, a holy gathering—do no work at all. It is my sabbath, wherever you live. “ ‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị.
4 "These are my appointed feasts, the holy gatherings that you are to proclaim at their appointed times. “ ‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka.
5 In the first month, on the fourteenth day of the month at twilight, is my Passover. Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị.
6 On the fifteenth day of that month is my Feast of Unleavened Bread; eat unleavened bread seven days. Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
7 On the first day hold a holy gathering; do no ordinary work. Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla.
8 Present a food offering to me for seven days. The seventh day is a holy gathering—do no ordinary work." Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ”
9 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
10 "Speak to the Israelites and say to them: When you enter the land I am giving you and reap its harvest, bring the priest a sheaf of the first of your harvest. “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu.
11 He will wave the sheaf before me for your acceptance; the priest will wave it the day after the Sabbath. Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya.
12 The day you wave the sheaf, offer me a flawless year-old male lamb as a burnt offering, Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
13 with its grain offering—about four quarts of fine flour mixed with oil, a food offering to me, a pleasing aroma—and its drink offering, about a quart of wine. Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ
14 Eat no bread, roasted grain, or fresh grain until this day, until you bring your Father's offering. This is a lasting statute for all generations, wherever you live. Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.
15 "Count off seven full weeks from the day after the Sabbath, the day you brought the wave-offering sheaf. “ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.
16 Count fifty days, until the day after the seventh Sabbath, then bring me a new grain offering. Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ.
17 From your homes, bring two loaves of fine flour, about four quarts, baked with yeast, as a wave offering of firstfruits to me. Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara Onyenwe anyị ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye Onyenwe anyị.
18 With the bread, present seven flawless year-old lambs, one young bull, and two rams. They are a burnt offering to me, with their grain and drink offerings—a food offering, a pleasing aroma to me. Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
19 Offer one male goat as a sin offering, and two year-old male lambs as a sacrifice of peace offerings. Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo.
20 The priest will wave them, with the bread of firstfruits and two lambs, as a wave offering before me. They are holy to me, for the priest. Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha.
21 Proclaim this same day, hold a holy gathering, and do no ordinary work. This is a lasting statute wherever you live, generation after generation. Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.
22 "Don't reap your field's edges bare or gather the gleanings when you harvest your land. Leave them for the poor and the foreigner. I am your Father." “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
23 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
24 "Tell the Israelites: on the first day of the seventh month, keep a day of complete rest, a memorial of trumpet blasts, a holy gathering. “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta.
25 Do no regular work; present me a food offering." Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.’ ”
26 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
27 "The tenth day of this seventh month is the Day of Atonement—hold a holy gathering, deny yourselves, and bring me a food offering. “Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ.
28 Do no work on that very day—it's the Day of Atonement, to atone for you before me, your Father. Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
29 Anyone who does not deny himself on that very day must be cut off from his people. Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
30 Anyone doing any work on that very day, I will destroy that person from among his people. Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
31 Do no work at all—a lasting statute, generation to generation, wherever you live. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32 This is a sabbath of complete rest for you; deprive yourselves. From evening on the ninth of the month until the next evening, keep your sabbath." Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.”
33 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
34 "Tell the Israelites: On this seventh month's fifteenth day, my Feast of Tabernacles begins, lasting seven days. “Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa.
35 The first day: a holy gathering. Do no ordinary work. Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
36 Seven days, present food offerings to me. On the eighth day hold a holy gathering and present a food offering to me—a solemn assembly. Do no ordinary work. Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
37 "These are my appointed times, which you are to proclaim as holy gatherings, presenting food offerings to me—burnt offering and grain offering, sacrifice and drink offerings—each on its own day, (“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.
38 besides my Sabbaths, besides your gifts, all your vow offerings, and all your voluntary offerings you give me. Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)
39 "So on the fifteenth day of the seventh month, once you've gathered the land's produce, celebrate my feast seven days: the first day a complete rest, the eighth day a complete rest. “ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.
40 On the first day, take fruit of majestic trees, palm fronds, leafy branches, and willows of the brook, and rejoice before me, your Father, seven days. Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.
41 Celebrate it as my feast seven days each year, a lasting statute for your generations; celebrate it in the seventh month. Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a.
42 Live in booths seven days; every native Israelite is to live in booths, Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a.
43 so your descendants may know I made the Israelites live in booths when I brought them out of Egypt. I am your Father." Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
44 So Moses announced to the Israelites the appointed feasts of our Father. Mosis gwara ụmụ Izrel ihe gbasara mmemme niile a kara aka nye Onyenwe anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]