Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 24 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "Command the Israelites to bring you pure, crushed olive oil for the light, to keep a lamp burning continually. “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
3 Outside the testimony's curtain in the tent of meeting, Aaron is to tend it before me from evening to morning, continually—a lasting law for your generations. Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu.
4 On the pure lampstand he must tend the lamps before me continually. Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
5 "Take fine flour and bake twelve loaves, each about four and a half pounds of flour. “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla.
6 Arrange them in two rows, six to a row, on the pure table before me. Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị.
7 Put pure frankincense on each row as the bread's memorial portion, a food offering to me. Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
8 Every Sabbath he must arrange it before me continually, from the Israelites, a lasting covenant. A ga-edo achịcha ndị a nʼihu Onyenwe anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
9 It belongs to Aaron and his sons, who must eat it in a holy place; it is a most holy portion for him from my food offerings, their permanent share." Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye Onyenwe anyị.”
10 The son of an Israelite woman, whose father was Egyptian, went out among the Israelites; the Israelite woman's son fought with an Israelite man in the camp. Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye Ijipt ma nne ya bụ onye Izrel, sitere nʼetiti ụmụ Izrel pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye Izrel na otu nʼime ndị ikom Izrel malitere ịlụ ọgụ.
11 The son of the Israelite woman blasphemed the Name with a curse, and they brought him to Moses. His mother was Shelomith, daughter of Dibri, of the tribe of Dan. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel kwuluru Aha ahụ kọchaa ya. Nʼihi ya, a kpọrọ ya ikpe nʼihu Mosis. (Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibri, onye ebo Dan.)
12 They put him in custody until our Father made his will clear to them. Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu Onyenwe anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya.
13 Then our Father spoke to Moses: Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
14 "Bring the one who cursed outside the camp. Let all who heard lay their hands on his head, then let the whole congregation stone him. “Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.
15 Tell the Israelites: Whoever curses our Father will bear their sin. Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya.
16 Whoever blasphemes my name must die—the whole community must stone him. Foreigner and native-born alike: whoever blasphemes the Name must die. Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu.
17 "Whoever kills any person must be put to death. “ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu.
18 Whoever kills an animal must make restitution for it, life for life. Onye gburu anụ ụlọ na-abụghị nke ya, ga-akwụghachi ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.
19 If anyone injures their neighbor, the same must be done to them: Onye ọbụla merụrụ mmadụ ibe ya ahụ, a ga-emerụkwa onye ahụ ahụ nʼebe o merụrụ ibe ya ahụ.
20 Fracture for fracture, eye for eye, tooth for tooth: as one injures another, so it is done to him. Onye tijiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-etiji ọkpụkpụ nke ya. Anya ga-alara anya, eze ga-alakwara eze. Otu e si merụọ mmadụ ahụ, ka a ga-esi merụọkwa onye merụrụ ya ahụ.
21 Whoever kills an animal repays for it; whoever kills a person is put to death. Onye ọbụla gburu anụ ụlọ onye ọzọ, ga-akwụ ụgwọ ya. Ma a ga-egbu onye ọbụla gburu mmadụ.
22 The same law applies to the foreigner and to the native-born alike, for I am your Father." Unu ga-enwe otu iwu nke ga-adị nye ndị amụrụ nʼala, dịkwara ndị ọbịa niile. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”
23 Moses told the Israelites; they took the one who had cursed outside the camp and stoned him with stones. The Israelites did as our Father commanded Moses. Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel okwu, nʼihi ya ha dọkpụụrụ onye nkwulu ahụ pụọ nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya nʼebe ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]