Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 25 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses on Mount Sinai, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya,
2 "Speak to the Israelites and say to them: When you enter the land I am giving you, the land is to keep a sabbath rest to me. “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye Onyenwe anyị.
3 For six years sow your field, six years prune your vineyard and gather its fruit. Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.
4 But the seventh year is a sabbath of full rest for the land, a sabbath to me—don't sow your field or prune your vineyard. Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu.
5 Don't reap what grows on its own, or gather grapes from your unpruned vine; the land gets a year of complete rest. Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.
6 The land's sabbath will feed you—yourself, your male and female servants, hired hand, and the foreigner living with you, Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu.
7 and for your livestock and the wild animals in your land—all it yields is food. Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri.
8 "You are to count seven sabbaths of years, seven times seven years, making forty-nine years in all. “ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu.
9 Blow the ram's horn in blasts on the tenth day of the seventh month; on the Day of Atonement, sound it throughout all your land. Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile.
10 Make the fiftieth year holy: proclaim freedom in the land for all its residents. It is a jubilee for you—each returns to their property, each to their family. Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya.
11 The fiftieth year is your jubilee: sow nothing, reap no self-grown grain, gather no untended vines. Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya.
12 For it is a jubilee; it is to be holy to you. Eat only what the field produces. Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi.
13 "In this Year of Jubilee each of you are to return to your own property. “ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a.
14 "If you sell or buy from your neighbor, do not cheat one another. “ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu.
15 Buy from your neighbor by the years since the jubilee; he sells to you by the years of harvests. Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ.
16 Raise the price for more years, lower it for fewer, since he's selling you a number of harvests. Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ.
17 You shall not wrong one another, but you are to fear your Father, for I am your Father. Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
18 "Follow my statutes, keep my rules, and obey them, and you will live securely in the land. “ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ.
19 The land will yield its fruit, and you will eat your fill and dwell in it securely. Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo.
20 If you ask, 'What will we eat in the seventh year, since we won't sow or gather our produce?' Unu nwere ike jụọ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eri nʼafọ nke asaa ahụ ebe ọ bụ na anyị agaghị akụ ihe ọbụla, maọbụ wee ihe ubi ọbụla nʼafọ ahụ?”
21 I will command my blessing on you in the sixth year, yielding crop for three years. Aga m ezitere unu ngọzị dị ukwuu nʼafọ nke isii, nke ga-eme ka ala mee ihe omume nke ga-ezuru unu afọ atọ.
22 You will plant in the eighth year but still eat old crop; until the ninth year's harvest comes in, you will eat the old. Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ.
23 "The land must not be sold permanently, for it is mine; for you are only foreigners and temporary residents with me. “ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m.
24 Throughout the land you possess, you are to grant a right of redemption for the land. Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.
25 "If your brother becomes poor and sells part of his land, his nearest redeemer must come redeem what his brother sold. “ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ.
26 If a man has no redeemer but prospers and finds enough to redeem it, Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.
27 he calculates the years since the sale, returns the balance to the buyer, and returns to his property. A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya.
28 But if he lacks means to repay him, what he sold stays with the buyer until Jubilee; it releases then, and he returns to his property. Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.
29 "If someone sells a house in a walled city, redemption rights last a full year from the sale. For that whole year the seller keeps this right. “ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya.
30 If not redeemed within a full year, the house in the walled city belongs to its buyer permanently, generation after generation; it isn't released at the jubilee. Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru.
31 Houses in villages without walls count as open fields; they may be redeemed and go free at Jubilee. Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.
32 "The Levites may always redeem the houses in the Levite cities they possess. “ ‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla.
33 If a Levite doesn't redeem it, the house sold in his city is released at jubilee, for houses in Levite cities are their property among Israel. Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
34 But the pasture fields around their cities cannot be sold; they are their permanent possession. Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi.
35 "If your brother becomes poor and cannot support himself among you, help him like a foreigner or resident, so he may live among you. “ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu.
36 Charge him no interest or profit, but fear your Father, so your brother may live alongside you. Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla.
37 You shall not lend him your money at interest or give him your food for profit. Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha.
38 I am your Father, who brought you out of Egypt to give you Canaan and be your Father. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu.
39 "If your brother beside you becomes poor and sells himself to you, don't make him work as a slave. “ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu.
40 He will be with you as a hired worker, as a resident, serving with you until Jubilee Year. Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe.
41 Then he and his children go free from you, returning to his clan and ancestral property. Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha.
42 For they are my servants, whom I brought from Egypt; they must not be sold as slaves are sold. Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu.
43 You shall not rule over him harshly, but you are to fear your Father. A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu.
44 "As for your male and female slaves: you may buy them from the nations around you. “ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.
45 Also buy from the foreign residents among you, and from their families with you, born in your land; they become your property. Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu.
46 You may leave them to your children as inherited property, holding them for life. But over your fellow Israelites you must not rule harshly, one over another. Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.
47 "If a foreigner or resident among you prospers and your brother becomes poor beside him, selling himself to the foreigner or to a branch of the foreigner's family, “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ,
48 he may be redeemed after he has sold himself. One of his brothers may redeem him. ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha.
49 His uncle or cousin may redeem him, or a close relative from his clan may redeem him; or if he affords it, he redeems himself. Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.
50 He and his buyer is to reckon from the year he sold himself to the Jubilee; the price follows the years, like a hired worker's wage. Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile.
51 If many years remain, he refunds a proportionate amount of his purchase price as his redemption payment. Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ.
52 If few years remain until Jubilee, he must calculate and refund his redemption price accordingly. Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri.
53 He is to be with him as one hired year by year, not ruled over harshly in your sight. A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha.
54 If he isn't redeemed this way, he and his children go free together in the Jubilee Year. “ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru.
55 Israel's people are my servants, whom I brought out of Egypt. I am your Father." Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]