Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Job 23 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara sị:

2“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.

3A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!

4Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu yawere ịrụ ụka mejuo ọnụ m.

5Aga m achọpụta ihe o ga-aza mma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.

6Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.

7Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.

8“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.

9Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.

10Ma ọ maara ụzọ m na-aga,mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,

11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.

12Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.

13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.

15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.

16Chineke emeela ka obi m daa mba;Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.

17Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]