Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 46 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So Israel set out with all he had, came to Beersheba, and sacrificed to our Father, whom his father Isaac had worshiped. Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik.
2 And our Father spoke to Israel in visions of the night, "Jacob, Jacob." He said, "Here I am." Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”
3 He said, "I am your Father, whom your father worshiped. Do not be afraid to go down to Egypt, for there I will make you a great nation. Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ.
4 I myself will go down with you to Egypt, and I will surely bring you back; and Joseph's own hand will close your eyes." Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.”
5 Jacob set out from Beersheba. Israel's sons carried their father Jacob, their little ones, and their wives in the wagons Pharaoh had sent for him. Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya.
6 They took their livestock and the goods they had acquired in the land of Canaan, and came to Egypt—Jacob and all his offspring with him. Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so.
7 His sons and grandsons, daughters and granddaughters—all his offspring he brought with him to Egypt. Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt.
8 These are the names of Israel's sons who came into Egypt—Jacob and his sons: Reuben, Jacob's firstborn. Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ya bụ Jekọb na ụmụ ụmụ ya, ndị sooro ya gaa Ijipt. Ruben, ọkpara Jekọb
9 The sons of Reuben: Hanoch, Pallu, Hezron, and Carmi. Ụmụ ndị ikom Ruben bụ, Hanok, na Palu, na Hezrọn na Kami.
10 The sons of Simeon: Jemuel, Jamin, Ohad, Jachin, Zohar, and Shaul the son of a Canaanite woman. Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul. Nne Shaul bụ nwanyị Kenan.
11 The sons of Levi: Gershon, Kohath, and Merari. Ụmụ ndị ikom Livayị bụ, Geshọn, na Kohat, na Merari.
12 Judah's sons: Er, Onan, Shelah, Perez, Zerah; but Er and Onan died in Canaan. Perez's sons: Hezron and Hamul. Ụmụ ndị ikom Juda bụ, Ịa, na Onan, na Shela, na Perez, na Zera. Ma Ịa na Onan nwụrụ nʼala Kenan. Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
13 The sons of Issachar: Tola, Puvah, Iob, and Shimron. Ma ụmụ ndị ikom Isaka bụ, Tola, na Puva, na Jashub, na Shịmrọn.
14 The sons of Zebulun: Sered, Elon, and Jahleel. Ụmụ ndị ikom Zebụlọn bụ, Sered, na Elọn, na Jaliil.
15 These are Leah's sons, born to Jacob in Paddan-aram, with his daughter Dinah; his sons and daughters numbered thirty-three. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Lịa mụụrụ Jekọb nʼala Padan Aram. Ọ mụtakwara otu nwanyị aha ya bụ Daịna. Ụmụ ndị ikom na ndị inyom ndị a dị iri atọ na atọ.
16 The sons of Gad: Ziphion, Haggi, Shuni, Ezbon, Eri, Arodi, and Areli. Ụmụ ndị ikom Gad bụ, Zefọn, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Eri, na Arodi na Areli.
17 Asher's sons: Imnah, Ishvah, Ishvi, Beriah, and their sister Serah. Beriah's sons: Heber and Malchiel. Ụmụ ndị ikom Asha bụ, Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwanne ha nwanyị bụ Sera. Ụmụ Beriya bụ, Heba na Malkiel.
18 These are the sons of Zilpah, whom Laban gave to his daughter Leah; she bore these to Jacob—sixteen in all. Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ.
19 The sons of Rachel, Jacob's wife: Joseph and Benjamin. Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ, Josef na Benjamin.
20 Manasseh and Ephraim were born to Joseph in Egypt by Asenath, daughter of Potiphera, priest of On. Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.
21 The sons of Benjamin: Bela, Becher, Ashbel, Gera, Naaman, Ehi, Rosh, Muppim, Huppim, and Ard. Ụmụ ndị ikom Benjamin bụ, Bela, Beka, Ashbel, Gera, Neeman, Ehi, Rosh, Mupim, Hupim na Aad.
22 These are the sons of Rachel who were born to Jacob—fourteen persons in all. Ndị a bụ ndị ikom nke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha dị iri na anọ.
23 The sons of Dan: Hushim. Nwa nwoke nke Dan mụrụ bụ, Hushim.
24 The sons of Naphtali: Jahzeel, Guni, Jezer, and Shillem. Ụmụ ndị ikom Naftalị bụ, Jaziil, na Guni, na Jeza, na Shilem.
25 These are Bilhah's sons, whom Laban gave to his daughter Rachel; she bore these to Jacob—seven in all. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa.
26 Jacob's direct descendants who came to Egypt—excluding his sons' wives—totaled sixty-six. Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii.
27 Joseph had two sons born in Egypt. Jacob's household that came to Egypt numbered seventy in all. Tinyere ụmụ ndị ikom abụọ amụtara nye Josef nʼIjipt, ndị si nʼezinaụlọ Jekọb gara Ijipt dị iri asaa.
28 Jacob sent Judah ahead to Joseph to lead the way to Goshen; they reached the land of Goshen. Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen,
29 Joseph readied his chariot and went up to Goshen to meet his father Israel. He appeared to him, fell on his neck, and wept on his neck a long time. Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge.
30 Israel said to Joseph, "Now let me die, since I've seen your face and you're still alive." Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”
31 Joseph told his brothers and his father's household, "I will go up and tell Pharaoh, and say to him, 'My brothers and my father's household, who were in Canaan, have come to me. Mgbe ahụ, Josef gwara ụmụnne ya na ndị ezinaụlọ nna ya niile sị, “Ka m gaa kọọrọ Fero. Ka m gaa sị ya, ‘Ụmụnne m na ezinaụlọ nna m, ndị bi nʼala Kenan abịakwutela m.
32 The men are shepherds, for they have been keepers of livestock; they've brought their flocks, herds, and all they have.' Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’
33 When Pharaoh calls you and says, 'What is your occupation?' Ya mere, ọ bụrụ na Fero akpọ unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ ọrụ aka unu?’
34 you will say, 'Your servants have raised livestock from our youth until now, we and our fathers,' so you may settle in Goshen; for every shepherd is detestable to the Egyptians." Unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ anụ ụlọ site na mgbe anyị bụ ụmụnta, dịka nna nna anyị ha bụ.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ekwe ka unu biri nʼala Goshen. Nʼihi na ndị niile na-azụ ewu na atụrụ bụ ndị akpọrọ asị nʼala Ijipt.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]