Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 45 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Joseph could not control himself before everyone standing by him, so he cried out, "Send everyone away from me!" No one stayed with him when Joseph made himself known to his brothers. Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ.
2 He wept so loudly that the Egyptians heard it, and Pharaoh's household heard it. O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara.
3 Joseph said to his brothers, "I am Joseph! Is my father still alive?" His brothers could not answer him, for they were terrified at his presence. Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya.
4 Joseph said to his brothers, "Please, come close to me." They came close. He said, "I am your brother Joseph, whom you sold into Egypt. Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt.
5 Now don't be distressed or angry with yourselves for selling me here, since our Father sent me ahead of you to preserve life. Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a.
6 Famine has been in the land two years now; five more years remain with no plowing or harvest. Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi.
7 Our Father sent me ahead of you to preserve a remnant for you on earth, and keep you alive as a great band of survivors. Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu.
8 So now, it wasn't you who sent me here, but our Father—he made me father to Pharaoh, lord of all his household, and ruler over all the land of Egypt. “Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.
9 Hurry, go up to my father, tell him: Your son Joseph says: Our Father has made me lord of all Egypt. Come down to me; don't delay. Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m.
10 You'll live in Goshen, near me—you, your children, your children's children, your flocks, your herds, all you own. Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere.
11 I will provide for you there—five years of famine remain—so you, your household, and all you own don't fall into poverty. Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’
12 Your eyes see, and my brother Benjamin's eyes see, that it is my own mouth speaking to you. “Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a.
13 Tell my father all my honor in Egypt, and all you have seen. Hurry and bring my father down here. Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.”
14 Then he threw his arms around his brother Benjamin and wept, and Benjamin wept on his neck." Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa.
15 He kissed all his brothers and wept over them. After that his brothers talked with him. Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka.
16 News reached Pharaoh's house: "Joseph's brothers have come." It pleased Pharaoh and his officials. Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ.
17 Pharaoh said to Joseph, "Say to your brothers: do this—load your animals, go, return to the land of Canaan. Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan.
18 Take your father and your households and come to me. I will give you the best of Egypt's land, and you will eat the richness of the land. Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ.
19 You are commanded: tell them, 'Do this—take wagons from Egypt for your children and wives, bring your father, and come. “Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu.
20 Don't worry about your belongings—the best of all Egypt's land is yours.'" Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’ ”
21 The sons of Israel did so; Joseph gave them wagons per Pharaoh's order, and gave them provisions for the road. Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ.
22 He gave each a change of clothes, but Benjamin 300 pieces of silver and five changes of clothes. O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise.
23 He sent his father ten donkeys loaded with Egypt's best, and ten female donkeys loaded with grain, bread, and food for his journey. O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya.
24 He sent his brothers off; as they left, he said, "Don't quarrel on the way." O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.”
25 So they left Egypt and came to their father Jacob in Canaan. Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha.
26 They told him, "Joseph is still alive—ruler over all Egypt!" But his heart went numb; he didn't believe them. Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu.
27 But when they told him all Joseph's words to them, and he saw the wagons Joseph sent to carry him, their father Jacob's spirit revived. Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri.
28 Israel said, "Enough! Joseph my son is still alive. I will go and see him before I die." Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]