Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 44 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then he told his house steward: "Fill the men's sacks with food, as much as they can carry, and put each man's silver at his sack's opening. Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya.
2 Put my cup, the silver cup, in the mouth of the youngest's sack, with his grain money." He did as Joseph said. Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya.
3 As soon as the morning was light, the men were sent away with their donkeys. Mgbe chi bọrọ, ha zipụrụ ndị ikom ndị a, ha na ịnyịnya ibu ha.
4 They had left the city, not yet far off, when Joseph told his steward, "Chase down the men. When you catch them, ask, 'Why have you repaid evil for good? Mgbe ha ji naanị ihe nta gafee obodo ahụ, Josef gwara odibo ya sị, “Bilie, chụso ndị ikom ndị ahụ ọsọ. I zute ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji were ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọma?
5 Isn't this the cup my lord drinks from and uses for fortune-telling? What you've done is evil.'" Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nna m ukwu, iko o ji aṅụ ihe ọṅụṅụ na nke o ji ajụ ase? Unu emeela ihe ọjọọ nʼihi ihe a unu mere.’ ”
6 When he overtook them, he spoke these words to them. Mgbe odibo ahụ zutere ha, ọ gwara ha ihe ndị a.
7 They said, "Why does my lord say such things? Your servants would never do such a thing. Ma ha zara sị ya, “Nna anyị ukwu, gịnị mere i ji ekwu ụdị okwu ndị a? Ihe arụ ka ọ bụ anyị ime ihe dị otu a.
8 Look, we brought back to you from Canaan the silver we found in our sacks' openings. How could we steal silver or gold from your master's house? Lee, ego anyị chọtara nʼọnụ akpa anyị ka anyị sitere nʼala Kenan weghachi. Olee otu anyị ga-esi zuru ọlaedo maọbụ ọlaọcha site nʼụlọ nna gị ukwu?
9 Whichever of your servants it's found with will die, and we'll become my lord's slaves too." Onye ọbụla nʼime anyị a chọtara iko a nʼaka ya ga-anwụ. Anyị onwe anyị ga-aghọrọ nna anyị ukwu ndị ohu.”
10 He said, "Good—let it be as you say. Whoever has it will be my slave; the rest of you are innocent." Odibo ahụ zara sị ha, “Ka ọ dịrị dịka unu kwuru. Onye ọbụla a chọtara ya nʼaka ga-abụ ohu m. Ma ndị a na-achọtaghị ya nʼaka ha enweghị ịta ụta ọbụla.”
11 Then each man quickly lowered his sack to the ground, and each man opened his sack. Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya.
12 He searched, starting with the oldest, ending with the youngest—the cup was found in Benjamin's sack. Odibo ahụ malitere nʼonye ukwu nʼetiti ha chọọ rute nʼonye nta. Ọ bụ nʼakpa Benjamin ka a chọtara iko ahụ.
13 Then they tore their clothes, and every man loaded his donkey, and they returned to the city. Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta.
14 When Judah and his brothers reached Joseph's house, he was still there, and they fell to the ground before him. Mgbe Juda na ụmụnne ya lọghachiri nʼụlọ Josef, ha hụrụ Josef ka ọ nọ nʼebe ahụ. Ha dara nʼala nʼihu ya.
15 Joseph said to them, "What have you done? Don't you know a man like me surely tells fortunes?" Ma Josef jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe a unu mere? Ọ bụ na unu amataghị na onye dịka m nwere ike ịmata onye zuru iko m?”
16 Judah said, "What can we say to my lord? What can we speak? How can we clear ourselves? Our Father has found your servants' guilt. Look—we are my lord's slaves, both we and the one in whose hand the cup was found." Ya mere Juda sị ya, “Gịnị ka anyị ga-ekwu? Olee otu anyị ga-esi gosi nʼaka anyị dị ọcha? Chineke ekpugheela ikpe ọmụma ndị ohu gị. Lee, anyị bụkwa ndị ohu onyenwe m. Anyị onwe anyị, tinyekwara onye a chọtara iko ahụ nʼaka ya.”
17 But he said, "I could never do this. Only the man in whose hand the cup was found will be my slave. The rest of you, go back to your father in peace." Ma Josef sịrị, “Ọ ga-abụrụ m ajọ omume ime ihe dị otu ahụ. Naanị nwoke ahụ a chọpụtara iko ahụ nʼakpa ya bụ onye ga-abụ ohu m. Ma unu onwe unu nwere ike laa nʼudo jekwuru nna unu nʼudo.”
18 Then Judah stepped forward and said, "Please, my lord, let your servant speak a word to you. Don't be angry with your servant, for you are like Pharaoh himself. Juda jekwuuru ya, sị, “Biko, onyenwe m, kwere ka ohu gị gwa gị okwu. Ewesola mụ bụ ohu gị iwe nʼihi na ị nọ ọnọdụ dị ka Fero.
19 My lord asked his servants, saying, 'Do you have a father or a brother?' Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’
20 We said to my lord, 'We have an old father, and a young son born late in life. His brother is dead; he alone is left of his mother's children, and his father loves him.' Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’
21 Then you told your servants, 'Bring him down to me so I can see him myself.' “Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’
22 We told my lord, 'The boy can't leave his father, because if he does, his father will die.' Ma anyị gwara onyenwe m sị na ‘Nwata a apụghị ịhapụ nna ya, nʼihi na nna ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya.’
23 You told your servants, 'If your youngest brother doesn't come down with you, you won't see my face again.' Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’
24 When we went back to my father, your servant, we told him what you had said. Mgbe anyị lakwuuru ohu gị bụ nna anyị, anyị gwara ya okwu onyenwe m kwuru.
25 And when our father said, 'Go again, buy us a little food,' “Mgbe nna anyị gwara anyị sị, ‘Laghachi gaa zụta nri,’
26 we said, 'We can't go down. If our youngest brother comes with us, then we will go. For we can't see the man's face unless our youngest brother is with us.' anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’
27 Then your servant my father said to us, 'You know that my wife bore me two sons. “Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ.
28 One left me, and I said, "Surely torn to pieces"; I haven't seen him since. Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya.
29 If you take this one too from me, and harm meets him, you'll bring my gray head down to the grave in grief. Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’
30 So when I come to your servant, my father, and the boy isn't with us, his life is bound to the boy's life, “Ya mere, ọ bụrụ na m alaghachikwute ohu gị, bụ nna anyị, ma nwantakịrị a esoghị anyị, ebe ọ bụ na e kekọtara ndụ nna anyị na ndụ nwantakịrị a,
31 when he sees the boy is gone, he'll die, and your servants will bring your servant our father down to the grave in sorrow.' mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ.
32 For your servant guaranteed the boy to my father, saying, 'If I don't bring him back to you, I'll bear the guilt before my father all my life.' Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’
33 So please, let your servant stay as my lord's slave instead of the boy, and let the boy return with his brothers. “Ya mere ugbu a, biko, ka ohu gị nọdụ dịka ohu onyenwe m nʼọnọdụ nwantakịrị a, ka nwantakịrị a soro ụmụnne ya laghachikwuru nna anyị.
34 How can I return to my father without the boy? I could not bear to see the disaster that would strike my father." Aga m esi aṅaa laghachikwuru nna m ma ọ bụrụ na mụ na nwantakịrị a esoghị? Enweghị m ike ilekwasị ihe ọjọọ ga-adakwasị nna m anya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]