Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 43 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now the famine was severe in the land. Ma ụnwụ a siri oke ike nʼala ahụ nʼoge a.
2 When they'd eaten the grain brought from Egypt, their father said, "Go back and buy us a little food." O ruo, mgbe ha richara nri ha zụtara nʼIjipt, nna ha gwara ha sị, “Jeghachinụ, zụtara anyị ntakịrị nri.”
3 But Judah told him, "The man firmly warned us: 'You won't see my face without your brother.' Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’
4 If you send our brother with us, we will go down and buy you food. Ọ bụrụ na ị ga-edunyere anyị nwanne anyị, anyị ga-agbada gaa zụtara gị nri.
5 But if you won't send him, we won't go, for the man said, 'You won't see my face without your brother.'" Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ”
6 Israel said, "Why did you harm me by telling the man you had another brother?" Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.”
7 They said, "The man questioned us closely about ourselves and our family: 'Is your father still alive? Do you have another brother?' We answered accordingly. How could we know he'd say, 'Bring your brother down'?" Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.”
8 Judah said to his father Israel, "Send the boy with me; let's go, so we may live and not die—we, you, and our children. Mgbe ahụ, Juda sịrị nna ya Izrel, “Dunye m nwantakịrị a ka anyị bilie gawa, ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ, ma anyị onwe anyị, ma gị, ma ụmụntakịrị anyị.
9 I pledge myself for him—demand him from me. If I don't bring him back and set him before you, I'll bear the blame before you forever. Aga m eji onwe m gbaa ebe nʼihi ya. I nwere ike itife ya nʼaka m. Ọ bụrụ na m akpọtaghachighị ya, kpọbata ya nʼihu gị, mgbe ahụ, ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị, nʼụbọchị ndụ m niile.
10 For if we had not delayed, surely by now we would have returned twice." A sị nnọọ na anyị egbughị oge niile a, anyị gaara aga ma lọtakwarị ugboro abụọ.”
11 Israel their father said to them, "If it must be so, do this: put the land's best products in your bags, and take the man a gift—a little balm, a little honey, spices, myrrh, pistachios, almonds. Mgbe ahụ nna ha Izrel gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-adịrịrị otu a, gịnị ọzọ ka anyị ga-eme. Kama mgbe unu na-aga, werenụ nʼakpa unu onyinye ịnata ihuọma nke bụ ihe niile kachasị mma nke si nʼala a welaara nwoke a. Werenụ nwantịntị mmanụ otite, na nwantịntị mmanụ aṅụ, ha na ụda dị iche iche, na eso osisi máá, na akụ, na alụmọnd.
12 Take double the money, and bring back what was returned in your sacks' mouths—perhaps an oversight. Werekwanụ ego okpukpu abụọ nʼaka unu. Weghachirinụ ya ego ahụ e tinyere nʼọnụ akpa unu, eleghị anya ọ bụ nʼohihie anya ka ha ji tinye ya.
13 Take your brother also, and go back to the man. Ngwa, kpọrọnụ nwanne unu nwoke bilienụ laghachikwurunụ nwoke ahụ.
14 May El Shaddai—our Father Almighty—grant you mercy before the man, so he releases your other brother and Benjamin. And as for me, if I'm bereaved of my children, I'm bereaved." Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, mee ka nwoke ahụ nwee obi ebere nʼebe unu nọ. Ya meekwa ka o nwee ike ịhapụrụ unu nwanne unu Simiọn na Benjamin ka ha soro unu lọta. Ọ bụrụkwanụ uche Chineke na m ga-agbara aka ụmụ, ya mee dịka o si chọọ.”
15 The men took the gift, twice the silver, and Benjamin, went down to Egypt, and stood before Joseph. Ya mere, ndị ikom ahụ weere onyinye ndị a, na okpukpu ego abụọ nʼaka, ma kpọrọkwa Benjamin. Ha biliri ije. Garuo Ijipt, ma guzo nʼihu Josef.
16 Seeing Benjamin with them, Joseph told his house steward, "Bring the men into the house, slaughter an animal, and prepare it—they'll eat with me at noon." Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”
17 The man did as Joseph said, and he brought the men into Joseph's house. Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef.
18 The men were afraid because they were brought into Joseph's house. They said, "It's because of the money returned in our sacks the first time, that we're brought in—to attack us, fall on us, seize us as slaves, and take our donkeys." Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”
19 So they approached the steward of Joseph's house and spoke to him at the door, Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ.
20 and said, "Please, sir, we indeed came down the first time to buy food. Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri.
21 At the lodge, when we opened our sacks, each man's silver was there in full weight, in his sack's mouth. We've brought it back with us. Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a.
22 We also brought more money to buy food, but don't know who put it in our sacks." Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.”
23 He said, "Peace to you, don't fear. Your Father and the God of your father gave you treasure in your sacks; your payment reached me." Then he brought Simeon out to them. Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn.
24 The man brought them into Joseph's house and gave them water, and they washed their feet; and he fed their donkeys. Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri.
25 So they readied the gift for Joseph's noon arrival, since they'd heard they would eat there. Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ.
26 When Joseph came home, they brought him the gift in their hands and bowed to him, to the ground. Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya.
27 He asked how they were, then said, "Is your father—the old man you mentioned—well? Is he still alive?" Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.”
28 They said, "Your servant our father is well, still alive." They bowed and prostrated themselves. Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya.
29 He looked up, saw his brother Benjamin, his mother's son, and asked, "Is this your youngest brother you told me about?" Then he said, "May our Father be gracious to you, my son." Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.”
30 Joseph hurried out, moved with compassion toward his brother, seeking a place to weep; he went into his room and wept there. Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.
31 Then he washed his face and came out; and he composed himself and said, "Serve the meal." Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ.
32 They served him alone, his brothers alone, Egyptians eating with him alone—Egyptians can't eat bread with Hebrews, detestable to them. Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ.
33 They sat before him: the firstborn by his birthright, the youngest by his youth—the men were astonished at one another. Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya.
34 He sent portions to them from his table, Benjamin's portion five times the others'. They drank and celebrated with him. O sitekwara na nri e doziri ya nyebinye ha nri. Nri e nyere Benjamin dị ukwuu okpukpu ise karịa nri nke e nyere ha niile. Ha na ya riri, ṅụọkwa nʼuju.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]