Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 47 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Joseph came and told Pharaoh, "My father and my brothers, with their flocks, herds, and all they own, have come from Canaan. They are now in Goshen." Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.”
2 From among his brothers he took five men and presented them to Pharaoh. Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero.
3 Pharaoh asked Joseph's brothers, "What is your work?" They told Pharaoh, "Your servants tend sheep, we and our fathers alike." Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.”
4 They said to Pharaoh, "We came to live in this land as foreigners, since there's no pasture for your servants' flocks—the famine is severe in Canaan. Now please let your servants settle in Goshen." Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.”
5 Pharaoh said to Joseph, "Your father and your brothers have come to you. Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen.
6 Egypt lies before you. Settle your father and brothers in the best of the land—let them live in Goshen. If you know capable men among them, put them in charge of my livestock." Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.”
7 Then Joseph brought his father Jacob in and presented him to Pharaoh, and Jacob blessed Pharaoh. Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero.
8 Pharaoh asked Jacob, "How many years have you lived?" Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”
9 Jacob answered Pharaoh, "My years as a wanderer are 130. Few and hard, they haven't reached my fathers' years of wandering." Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.”
10 Then Jacob blessed Pharaoh and went out from his presence. Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.
11 So Joseph settled his father and brothers, giving them land in Egypt's best territory, the region of Rameses, as Pharaoh had ordered. Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu.
12 Joseph fed his father, his brothers, and all his father's household, by the number of their children. Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.
13 No food remained in all the land, for the famine was very severe, and the land of Egypt and land of Canaan wasted from the famine. Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a.
14 Joseph gathered all the silver found in the land of Egypt and the land of Canaan for the grain they were buying, and Joseph brought the silver into Pharaoh's house. Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero.
15 When the silver ran out in the land of Egypt and land of Canaan, all the Egyptians came to Joseph, saying, "Give us food! Why should we die before you? Since silver is gone." Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.”
16 Joseph answered, "Turn over your livestock; I'll give you food in exchange for your livestock, since your silver's gone." Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.”
17 They brought their livestock to Joseph, and he gave them bread for the horses, flocks, herds, and donkeys. He provided them bread that year for all their livestock. Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile.
18 That year ended, and they came to him the second year and said, "We can't hide from my lord that our silver is gone and the livestock belong to my lord; nothing is left for my lord but our bodies and our land. Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị.
19 Why die before your eyes—we and our land? Buy us and our land for food; we and our land will serve Pharaoh. Give us seed to live, not die, and keep the land from turning desolate." Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.”
20 So Joseph bought all Egypt's land for Pharaoh, because each Egyptian sold his field—the famine was too severe for them. The land became Pharaoh's. Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero.
21 He moved the people into the cities, from one end of Egypt to the other. Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya.
22 Only he did not buy the priests' land, since Pharaoh gave them a fixed portion they lived on; so they did not sell their land. Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha.
23 Joseph told the people, "Look, I have bought you and your land for Pharaoh today. Here's seed—sow the land. Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero.
24 At harvest, give Pharaoh a fifth; keep four parts as seed for the field and food for you, your households, and your children." Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.”
25 They said, "You saved our lives. May we find favor in my lord's eyes, and we will be Pharaoh's slaves." Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.”
26 So Joseph made it law in Egypt—still in force today—that a fifth goes to Pharaoh. Only the priests' land did not become Pharaoh's. Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a.
27 Israel lived in Egypt's land, in Goshen's land. They gained property there, and were fruitful and multiplied greatly. Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ.
28 Jacob lived in Egypt seventeen years; his life totaled 147 years. Jekọb biri nʼala Ijipt afọ iri na asaa. Ya mere, afọ niile Jekọb gbara bụ narị afọ na iri afọ anọ na asaa.
29 When Israel's time to die drew near, he called his son Joseph and said, "If I have found favor with you, please put your hand under my thigh and show me faithful love and loyalty. Please don't bury me in Egypt, Mgbe ụbọchị ọnwụ Izrel na-abịaru nso, ọ kpọrọ Josef nwa ya sị ya, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, tinye aka gị nʼokpuru apata m, kwee m nkwa na ị ga-egosi m obi ebere na ezi ntụkwasị obi. Elila m nʼala nʼIjipt.
30 but let me lie with my fathers. Carry me out of Egypt and bury me in their tomb." Joseph said, "I will do as you say." Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.”
31 Jacob said, "Swear to me." Joseph swore to him. Then Israel bowed at the head of his bed. Ọ sịrị ya, “Ṅụọrọ m iyi na ị ga-eme ya.” Josef ṅụọrọ ya iyi. Izrel nʼonwe ya, kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]