Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Adam slept with his wife Eve; she conceived and bore Cain, saying, "With our Father's help I have gained a man." Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka Onyenwe anyị, amụtala m nwa nwoke!”
2 Later she gave birth to his brother Abel. Abel kept flocks, and Cain worked the ground. Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi.
3 After some time, Cain brought our Father an offering of the ground's fruit. Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara Onyenwe anyị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye.
4 Abel, too, brought the firstborn of his flock and their fat portions. Our Father favored Abel and his offering, Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. Onyenwe anyị nabatara Ebel na onyinye ya,
5 but not on Cain and his offering, so Cain burned with anger and his face fell. ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ.
6 Then our Father said to Cain, "Why are you angry? Why has your face fallen? Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ?
7 If you do right, won't you be accepted? If you don't, sin crouches at your door, longing for you—but you must rule over it." Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.”
8 Cain said to his brother Abel, "Let's go to the field." There, Cain rose against his brother Abel and killed him. Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya.
9 Then our Father asked Cain, "Where's your brother Abel?" "I don't know," he said. "Am I my brother's keeper?" Emesịa, Onyenwe anyị jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?”
10 Our Father said, "What have you done? The voice of your brother's blood cries out to me from the ground. Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala.
11 Now a curse drives you from the ground, which opened its mouth to take your brother's blood from your hand. Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị.
12 When you work the ground, it will no longer give you its strength; you will be a wandering fugitive on the earth." Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.”
13 Cain said to our Father, "My punishment is more than I can bear. Ken zara Onyenwe anyị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu.
14 Today you drive me from this ground; I'll be hidden from your presence, a restless fugitive on earth, and whoever finds me will kill me." Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.”
15 But our Father told him, "No—whoever kills Cain will be avenged seven times over." Then our Father marked Cain, so no one who found him would kill him. Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya.
16 Cain left the presence of our Father and settled in the land of Nod, east of Eden. Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.
17 Cain slept with his wife; she conceived and bore Enoch. He was building a city and named it after his son Enoch. Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke.
18 Irad was born to Enoch. Irad fathered Mehujael, Mehujael fathered Methushael, Methushael fathered Lamech. Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.
19 Lamech married two women, one named Adah and the other Zillah. Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.
20 Adah bore Jabal, father of tent dwellers and livestock herders. Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.
21 His brother's name was Jubal; he was the father of all who play the harp and flute. Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi.
22 Zillah also bore Tubal-Cain, forger of all bronze and iron tools; Tubal-Cain's sister was Naamah. Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama.
23 Lamech told his wives: "Adah and Zillah, hear me; wives of Lamech, listen to what I say. I killed a man who wounded me, a young man who bruised me. Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ.
24 If Cain is avenged seven times, then Lamech seventy-seven times." Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.”
25 Adam slept with his wife again; she bore a son and named him Seth: "Our Father has given me another child instead of Abel, since Cain killed him." Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”
26 Seth too had a son and named him Enosh. Then people began calling on our Father's name. Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh. Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]