Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 This is the written record of Adam's descendants. When our Father created humankind, he made them in the likeness of God. Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
2 He created them male and female, blessed them, and named them Humankind when they were created. O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
3 At 130, Adam fathered a son in his likeness, after his image, and named him Seth. Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
4 After he fathered Seth, Adam lived 800 years and had other sons and daughters. Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
5 Altogether, Adam lived 930 years, and then he died. Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
6 When Seth had lived 105 years, he fathered Enosh. Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
7 After he fathered Enosh, Seth lived 807 years and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
8 Altogether, Seth lived 912 years, and then he died. Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
9 When Enosh had lived ninety years, he fathered Kenan. Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
10 After he fathered Kenan, Enosh lived 815 years and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
11 Altogether, Enosh lived 905 years, and then he died. Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
12 When Kenan had lived seventy years, he fathered Mahalalel. Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
13 After he fathered Mahalalel, Kenan lived 840 years and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14 Altogether, Kenan lived 910 years, and then he died. Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
15 When Mahalalel had lived sixty-five years, he fathered Jared. Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
16 After he fathered Jared, Mahalalel lived 830 years and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
17 Altogether, Mahalalel lived 895 years, and then he died. Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
18 When Jared had lived 162 years, he fathered Enoch. Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
19 After he fathered Enoch, Jared lived 800 years and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20 Altogether, Jared lived 962 years, and then he died. Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
21 When Enoch had lived sixty-five years, he fathered Methuselah. Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
22 After fathering Methuselah, Enoch walked with our Father 300 years, and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
23 Altogether, Enoch lived 365 years. Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
24 Enoch walked faithfully with our Father; then he was gone, because our Father took him. Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
25 When Methuselah had lived 187 years, he fathered Lamech. Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
26 After he fathered Lamech, Methuselah lived 782 years and had other sons and daughters. Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
27 Altogether, Methuselah lived 969 years, and then he died. Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
28 When Lamech had lived 182 years, he fathered a son. Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
29 He named him Noah, saying, "He will comfort us in our work and painful toil of our hands, from the ground our Father cursed." Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
30 After he fathered Noah, Lamech lived 595 years and had other sons and daughters. Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
31 Altogether, Lamech lived 777 years, and then he died. Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
32 When Noah was 500 years old, he fathered Shem, Ham, and Japheth. Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]