Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When humanity began to multiply on the earth and daughters were born to them, Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom,
2 the sons of divine origin saw the daughters of human origin were beautiful, and took as wives any they chose. ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.
3 Then our Father said, "My Spirit will not wrestle with humanity forever, for they are flesh; their days will be 120 years." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”
4 The Nephilim were on the earth in those days, and afterward too, when the sons of divine origin came to the daughters of human origin, who bore them children. These were the mighty men of old, men of renown. Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama.
5 Our Father saw how great human wickedness had become on the earth—every thought and desire of their hearts only evil all the time. Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.
6 He was grieved he had made humanity on the earth, and his heart filled with pain. O wutere Onyenwe anyị nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu.
7 So our Father said, "I will wipe out humanity, whom I created, from the face of the earth—people, animals, crawling things, and birds of the sky—for I regret making them." Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.”
8 But Noah found favor in the eyes of our Father. Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.
9 This is Noah's account. Noah was a righteous man, blameless among the people of his time, and Noah walked faithfully with our Father. Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
10 And Noah had three sons: Shem, Ham, and Japheth. Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet.
11 The earth was corrupt before our Father, and filled with violence. Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
12 Our Father saw the earth was corrupt, for all flesh had corrupted their ways on the earth. Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.
13 Then our Father said to Noah, "The end of all flesh has come before me, for the earth is full of violence because of the people. I am going to destroy them with the earth. Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.
14 Build yourself an ark of cypress wood; make rooms in it and coat it inside and out with pitch. Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.
15 Make it like this: the ark about 450 feet long, seventy-five feet wide, forty-five feet high. Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.
16 Make a roof for the ark, finishing it eighteen inches from the top. Put a door in its side, and build it with lower, middle, and upper decks. Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.
17 I myself am bringing floodwaters on the earth to destroy all flesh with the breath of life in it under the heavens; everything on the earth will die. Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.
18 But I will establish my covenant with you, and you will enter the ark—you, your sons, your wife, and your sons' wives with you. Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
19 Bring two of every living creature into the ark to keep alive with you—a male and a female. Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ.
20 Of the birds by kind, the animals by kind, every crawling thing of the ground by kind, two of each will come to you to be kept alive. Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ.
21 Take every kind of food that can be eaten and store it up; it will be food for you and for them." Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.”
22 Noah did everything just as our Father commanded him. Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]