Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then our Father told Noah, "Enter the ark with your whole household, for I've seen you righteous before me in this generation. Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
2 Take for yourself seven pairs of every clean animal, male and female, and one pair of unclean animals, male and female, Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye,
3 also seven pairs of sky birds, male and female, to keep offspring alive across all the earth. na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.
4 For in seven days I'll rain on the earth forty days and forty nights, and wipe out every living thing I made from the face of the ground." Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
5 Noah did everything our Father commanded him. Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
6 Noah was 600 years old when the floodwaters came upon the earth. Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
7 He, his sons, his wife, and his sons' wives entered the ark to escape the floodwaters. Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
8 Of clean animals and animals not clean, of birds and all that crawls on the ground. Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
9 Two by two, male and female, came to Noah in the ark, as our Father commanded Noah. oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
10 After the seven days, the floodwaters came upon the earth. Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
11 In Noah's six hundredth year, second month, day seventeen—that same day—all springs of the great deep burst open, and heaven's floodgates opened. Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
12 The rain fell on the earth for forty days and forty nights. Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
13 That day Noah entered the ark—he, his sons Shem, Ham, Japheth, his wife, and his sons' three wives. Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.
14 They and every wild animal by their kind, every livestock by their kind, every crawler on earth by their kind, every bird by their kind, every winged creature. Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.
15 They came to Noah, into the ark, two by two, all flesh with breath of life. Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.
16 Male and female of all flesh entered, as our Father commanded him; then our Father shut him in. Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.
17 The flood lasted forty days on the earth; the waters rose, lifted the ark, floating above the earth. Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
18 Waters surged and rose greatly over the earth, and the ark floated on the water's surface. Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.
19 Waters rose higher and higher on the earth, covering all the high mountains under the whole sky. Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
20 About twenty-two feet deep the waters rose above the mountains, covering them. Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.
21 Everything moving on earth died: birds, livestock, wild animals, all creatures swarming the earth, and all mankind. Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
22 Everything on dry land that had the breath of life in its nostrils died. Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
23 Our Father wiped out every living thing on the ground's face—people, animals, crawling creatures, birds of the sky—and wiped them from the earth. Only Noah and those with him in the ark remained. Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
24 And the waters prevailed over the earth 150 days. Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]