Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 But our Father remembered Noah, all the living creatures, and all the livestock with him in the ark, and swept a wind over the earth so the waters began to recede. Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta.
2 The springs of the deep and heaven's floodgates closed, and rain from the sky stopped. A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa.
3 Water kept receding from the earth, and after 150 days it had gone down. Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.
4 The ark rested on the mountains of Ararat on the seventeenth day of the seventh month. Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.
5 The waters kept receding until the tenth month; on its first day, the mountaintops appeared. Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
6 After forty days, Noah opened the window he had made in the ark, Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
7 he sent out a raven, and it flew back and forth until the waters dried up from the earth. site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala.
8 Then he released the dove from him to see if the waters had subsided from the ground's surface. Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala,
9 But the dove found no resting place for her foot and returned to him in the ark, since water still covered the whole earth's surface. So he reached out his hand, took her, and brought her back into the ark. ma nduru ahụ achọtaghị ebe o nwere ike ibe, nʼihi na mmiri ka tojuru elu ụwa niile. Nʼihi ya, nduru ahụ lọghachikwutere Noa nʼime ụgbọ ahụ. Noa setịpụrụ aka ya nwụbata nduru ahụ nʼụgbọ.
10 He waited seven more days and again sent out the dove from the ark. Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụrụ nduru ahụ ọzọ
11 The dove returned to him that evening with a freshly plucked olive leaf in her beak, so Noah knew the waters had receded from the earth. Nʼoge anyasị, nduru a lọghachiri. Ọ kpụ akwụkwọ oliv ọhụrụ ọ kụbitere nʼọnụ ya. Nke a gosiri Noa na mmiri ahụ ataala nʼelu ala.
12 He waited seven more days, then sent the dove out again; it did not return to him again. Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụkwara nduru ahụ ọzọ. Ma nʼoge a, ọ lọtakwaghị ọzọ.
13 In Noah's 600 and first year, the first day of the first month, the waters had dried up from the earth. Noah removed the ark's covering, looked out, and saw the ground's surface was dry. Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala.
14 By the twenty-seventh day of the second month the earth was completely dry. Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala.
15 Then our Father said to Noah, Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,
16 "Leave the ark: you and your wife and your sons and your sons' wives with you. “Site nʼụgbọ mmiri pụta, gị na nwunye gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
17 Bring out with you every living creature—all flesh: birds, animals, everything that crawls on the ground—so they may swarm across the earth, be fruitful, and multiply on the earth." Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.”
18 So Noah came out, together with his sons and his wife and his sons' wives. Ya mere, Noa si nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, ya na ụmụ ya, na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya.
19 Every animal, every crawling thing, every bird—everything that moves on the earth—left the ark by their kinds. Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta.
20 Noah built an altar to our Father, took some of every clean animal and every clean bird, and offered burnt offerings on it. Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ.
21 Our Father smelled the pleasing aroma and said in his heart, "I will never again curse the ground because of humanity, though the human heart's inclination is evil from youth, nor will I ever again strike down every living thing as I have done. Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.
22 As long as the earth endures, seedtime and harvest, cold and heat, summer and winter, day and night will never cease." “Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide, oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi, oge oyi na oge okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri, ehihie na abalị, agaghị ebi.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]